Iseoluwa Abidemi

Onye egwu ozioma nke Naijiria
Iseoluwa Abidemi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya19 Disemba 2004 Dezie
Ebe ọmụmụȮra Ogun Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-abụ abụ, singer-songwriter, gospel singer Dezie
Ọrụ ama amaYes I Can Dezie

Iseoluwa Abidemi (amụrụ n'ọnwa Disemba 18, 2004) bụ onye n'abụ abụ ozioma na Naijiria, onye n'ede egwu nakwa onye nkpọkọta ihe nkiri nke Iseoluwa. [1][2] Nne ya chọpụtara nkà egwu ya mgbe ọ dị afọ ise ma tinye ya n'òtù ukwe ụlọ akwụkwọ ya n'enye nkwado ma n'eduzi ọrụ. O weputara egwu izizi ya akpọrọ Iseoluwa n'afọ 2017 n'afere egwu izizi ya Yes I Can n'afọ 2019. A kpọrọ ya onye egwu Africa nke Afọ (2019) site na Continental Child Summit and Awards dị na Africa.

Ndụ nakwa ọrụ egwu dezie

A mụrụ Abidemi na Shimawa, Ogun Steeti, Nigeria dị ka nwa mbụ n'ime ụmụ atọ. Ọ gara Emerald Primary School tupu ọ gaa Chrisland High School.[3] Ọ malitere igosi nkà egwu ya n'ụlọ site n'isonye n'ịbụ abụ ozioma n'igwe oyonyo mgbe ọ dị afọ ise. Nne ya, onye na-agụ egwú na ụka ya chọpụtara nkà ahụ ma tinye ya n'òtù ukwe ụlọ akwụkwọ ya n'eduzi n'ọrụ nkwado.[4][5] N'afọ 2017, ọ wepụtara egwu izizi ya bụ Iseoluwa ma mee ihe ngosi egwu mbụ ya n'afọ 2017 nke akpọrọ The Iseoluwa[6] Concert, nke ọ rụkwara ọzọ n'afọ 2018.[7] O weputara afere egwu izizi ya Yes I Can n'afọ 2019 ya na egwu egwu dịka Mo ti Giao nakwa Just Praise nke Wole Oni Music Production mepụtara.[8][2] O duziri egwu ọzọ n'afọ 2019 na Lagos nke akpọrọ Iseoluwa Live In Concert iji kwalite afere egwu ọhụrụ ya.[9] Abidemi kọwara na ebumnuche nke afere egwu Yes I Can bụ ịgwa ndị n'eto eto na ha kwesịrị "ikwere n'onwe ha ma ghara ịda mbà n'oge ọ bụla".[10]

Abidemi ekwuola na ọ bụ ezie na "egwú bụ ihe na-atọ m ụtọ", ọ ga-achọkwa ịmụ iwu na agụmakwụkwọ.[11] Ọ na-ewere ndị na-agụ egwú dị ka Aṣa na Nathaniel Bassey dị ka ndị n'akpali egwu ya.[12]

Edensibịa dezie

  1. Nwanne. "Iseoluwa… Another kid star steps out bold", The Guardian (Nigeria), February 17, 2018. Retrieved on December 19, 2021.
  2. 2.0 2.1 Adeola. "Iseoluwa Abidemi soars in ‘Mo ti G’oke’", The Punch, September 14, 2019. Retrieved on December 19, 2021. Kpọpụta njehie: Invalid <ref> tag; name ":0" defined multiple times with different content
  3. "A Rising Star", This Day, September 8, 2017. Retrieved on December 19, 2021.
  4. Ebirim. "I wish I could meet with the president – Iseoluwa Abidemi, teen gospel act", Vanguard, May 27, 2018. Retrieved on December 19, 2021.
  5. "14-year-old’s Iseoluwa eyes shutting down Eko Hotel", The Nation, October 6, 2019. Retrieved on December 19, 2021.
  6. Sesan. "Our society’s filled with immoral songs –Iseoluwa", The Punch, August 19, 2017. Retrieved on December 19, 2021.
  7. Uche. "Iseoluwa Abidemi releases new single, announces new album, NGO launch", Lailas News, November 12, 2019. Retrieved on December 19, 2021.
  8. "Young Star, Iseoluwa, Releases New Single ‘Yes, I Can’, Announces Album And NGO Launch", Nigerian Tribune, November 8, 2019. Retrieved on December 19, 2021.
  9. Akutu. "Abidemi In Lagos for Iseoluwa Concert", The Guardian (Nigeria), October 20, 2019. Retrieved on December 20, 2021.
  10. "‘Yes I Can album dear to my heart’", The Sun (Nigeria), November 16, 2019. Retrieved on December 20, 2021.
  11. "12 year-old singer, Iseoluwa drops 'Iseoluwa'", Vanguard, August 18, 2017. Retrieved on December 20, 2021.
  12. "Kid Star, Iseoluwa Unveils Maiden Album", This Day, August 25, 2017. Retrieved on December 20, 2021.