Gbemi Olateru Olagbegi
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1984 |
Ebe ọmụmụ | Surulere |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba |
ọrụ ọ na-arụ | àgwà redio |
ebe agụmakwụkwọ | Oakland University |
oge ọrụ ya (mmalite) | 2008 |
Gbemi Olateru Olagbegi bụ onye mgbasa ozi na onye nchikọta na Nigeria, a maara maka nchikọta mmemme nakwa The Beat 99.9 FM . O meriri "on-air personality of the year" na 2008 Future Awards ma, dika onye so n'otu Naijiria The Unrulies, a hoputara ya ozo na onyinye nturu ugo nke 2009; na otu afọ ahụ, ya na Jedidiah, onye ome ochi, kwadoro emume Future Awards. Ọ bụ Celebrity Model maka ngwaahịa ntutu Soul Mate. Ọ bụ onye nduzi mmemme ugbu a na Naija FM 102.7FM, otu ụlọ ọrụ redio amaala.
Mmalite Ndụ
dezieA mụrụ Gbemi n'onwa Julaị 18, n'afọ 1984 dị ka Omoba nke ezinụlọ Olagbegi na Owo ,obodo dị na Ondo Steetị, ndịda ọdịda anyanwụ Nigeria. Ọ gara akwụkwọ na Pampers Private school, Surulere na Nigerian Navy Secondary School, Ojo. Ọ gakwara Queens College, Yaba tupu ọ gawa Oakland University, ebe ọ nwetara akara ugo mmụta na Mass Communication. O nwetakwara nzere masta na Media and Communication na Pan African University, Lagos State n'afọ 2009.
Onyinye
dezieThe Future Awards - 2008 - "On Air Personality of the Year". Ọ ritekwara 'Dynamix Awards' maka onye na-achIkọta ihe na redio nke afọ n'afọ 2008. O merikwara "Green Awards for Excellence" maka ngalaba redio n'afọ ahụ. N'afọ 2009, o ritere “Exquisite Lady of the Year” maka onyinye nke “Nwanyị Na-eme Ihe Omume na redio Kasị Mma” ma n'afọ 2010, a họpụtara ya ọzọ maka “The Future Awards”. O ritere ihe nrite City People Awards nakwa Nigerian Media Merit Awards n'afọ 2016 dịka On Air Personality of the Year.