Fatima Batul Mukhtar
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 23 Mee 1963 |
Ebe ọmụmụ | Kano |
ọrụ ọ na-arụ | botanist, academic |
ebe agụmakwụkwọ | Bayero University Kano, Ahmadu Bello University |
Fatima Batul Mukhtar bụ nwaafọ Naịjirịa gụrụ akwụkwọ, nke bụ prọfesọ na Botani . Nnyocha ya gbadoro ụkwụ na "growth regulation, biostatistics, biotechnology and plant conservation". N’afọ 2016, onyeisiala Muhammadu Buhari họpụtara ya dịka onye osote onye isi ọchịchị Federal University Dutse . [1]
Mmalite ndu na mmụta ya
dezieA mụrụ Mukhtar na Kano n'afọ 1963. [2] Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị nke Shahuchi nakwa Shekara Girls Boarding Primary School maka agụmakwụkwọ praịmarị ya, were gazie Government Girls College,nke Dala dị na Kano maka ụlọ akwụkwọ sekọndịrị ya. [3] N'afọ 1984, o nwetara nzere bachelọ na botani na Mahadum nke Ahmadu Bello . N’afọ 1994, o nwetara nzere masta na mahadum nke Bayero . Ọ gụsịrị akwụkwọ mmụta dọktọreti n'afọ 2005, bụrụ ọkachamara na nkà mmụta ọgwụ osisi site n'otu ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ. N'afọ 2012, o debara aha ya n'agụmagụ akwụkwọ banyere nkà na ụzụ ọrụ ugbo na mahadum nke Michigan Steeti . Ọ bụ otu n'ime ndị isi ntọala ọchịchị na Mahadum nke Northwest Kano, bụrụkwa diin mbụ nke sayensị n'ụlọ akwụkwọ ahụ. N'afọ 2015, e mere ya osote onye isi oche nke ụlọ akwụkwọ ahụ. [4] N'afọ 2016, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote onye isi nke Federal University Dutse . [5]
Nrụtụaka
dezie- ↑ 5 women who have made their marks in education (en-US) (2018-03-08).
- ↑ Suleiman, Mustapha (March 11, 2016). Fatima takes over as VC, Federal University Dutse. Archived from the original on November 7, 2017. Retrieved on November 17, 2020.
- ↑ admin. Fatimah Batul Mukhtar. Archived from the original on 2017-11-07. Retrieved on 2020-11-17.
- ↑ I don't feel intimidated in the midst of men (May 27, 2017). Archived from the original on July 1, 2019. Retrieved on November 17, 2020.
- ↑ Buhari Appoints New Vice Chancellors For 12 Universities (February 15, 2016).