Eucharia Anunobi

onye na-eme ihe nkiri nigerian
Eucharia Anunobi
Mmádu
Ụlọ ọrụ mmepụta iheụlọ ọrụ ihe nkiri Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Aha enyereEucharia Dezie
aha ezinụlọ yaAnunobi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya25 Mee 1965 Dezie
Ebe ọmụmụOwẹrrẹ Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee ihe nkiri Dezie
ụdị ọrụ yatheater arts Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum nke Nigeria Dezie
ogo mmụtaBachelor of Arts Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)1995 Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaEfefe Kraịst Dezie
Ụcha ime anyabrown Dezie
ụcha ntụtụ isiNtụtụ ojii Dezie
nnọchiaha nkeonweL484 Dezie

Eucharia Anunobi, (onye a mụrụ na abali iri abụọ na ise na ọnwa nke ise n'afọ 1965) bụ nwa afo Nigeria, na-eme ihe nkiri, na emeputa ihe nkiri, ma bụrụ kwa onye ukọ chụkwụ ụka agbara ọhụrụ akpọrọ pastọ na olu bekee. A maara ya nke ọma maka ọrụ ya na ihe nkiri Abuja Connection. [1] A hoputara ya na 2020 Africa Magic Viewers' Choice Awards maka Onye ihe nkiri nwanyi kacha mma kwado na ihe nkiri ma ọ bụ ihe nkiri Igwe onyonyo na ga n'ihu na usoro nke bekee kpọrọ Best Supporting Actress in a Movie or TV Series. [2]

Mmalite ndụ na ọrụ dezie

A mụrụ Eucharia na Owerri, Imo Steeti, n'ebe bi wee gụchaa ụlọ akwụkwọ praịmarị na nke sekọndrị tupu ọ gawa Institute of Management Technology, Enugu ebe ọ gụsịrị akwụkwọ nke diplọma National na Mass Communication. [3] Ọ nwekwara nzere bachelọ nke nka mgbe ọ mụsịrị Asụsụ Bekee na Mahadum nke Nigeria, Nsukka . Eucharia bịara pụta ìhè dị ka onye na-eme ihe nkiri maka ọrụ ya na usoro ihe nkiri Glamor Girls na afọ 1994. Ọ gaa n'ihu na ime ihe nkiri dị iche iche karịa iri itoolu gụnyere Abuja Connection na Letters to a Stranger . [4] Ọ na-eje ozi ugbu a dịka onye nkwusa ozioma n'otu ụka dị na Egbeda, Lagos Steeti . [5] Otu nwa nwoke Eucharia mụtara, Raymond, onye ọ kọwara dị ka ezigbo enyi ya nwuru [6] n'ihi nsogbu sitere na ọrịa sickle cell anemia na ọnwa August, n'ụbọchị iri abụọ na abụọ na afọ 2017. Ọ dị afọ 15 wee la n'mụọ. [7]

Ntụrụaka dezie

Njikọ dị na mpụga dezie

Eucharia Anunobi on IMDb