Entissar Amer
[1]Entissar Amer (Arabic; amụrụ ya na 3 Disemba 1956) bụ nwanyị mbụ nke Ijipt ugbu a, ebe bụ na di ya Abdel Fattah el-Sisi ghọrọ onye isi ala nke isii nke Ijipt na 8 June 2014.
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Egypt |
aha enyere | Entissar |
aha ezinụlọ ya | Amer |
ụbọchị ọmụmụ ya | 3 Disemba 1956 |
Ebe ọmụmụ | Cairo |
Dị/nwunye | Abdel Fattah el-Sisi |
nwa | Mahmoud El-Sisi |
Asụsụ obodo | Egyptian Arabic |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic, Egyptian Arabic |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | First Lady of Egypt |
ebe agụmakwụkwọ | Ain Shams University |
okpukpere chi/echiche ụwa | Okpukpere Alakụba |
Mmụta
dezieAmer nwetara diplọma ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya na El Abbassia High School n'afọ 1977. O nwetara nzere BCom na ndekọ ego na Mahadum Ain Shams .[1]
Ezinụlọ
dezieAmer lụrụ nwa nwanne nne ya el-Sisi na 1977 mgbe el-Ssi gụsịrị akwụkwọ na Military Academy.[1][2] Ha nwere ụmụ nwoke atọ na otu nwa nwanyị: Mahmoud, Mostafa, Hassan na Aya.[3]
Amer ghọrọ Nwunye Mbụ nke Egypt na nhọpụta di ya ka ọ bụrụ Onye isi ala Egypt ka emechara ngagharị iwe ndị Egypt nke June 2013; nke mere ka ndị agha kwatuo Mohamed Morsi n'ọchịchị. A họpụtara onye ọka ikpe Adly Mansour dị ka onye isi oche n'oge mgbanwe site na 3 Julaị 2013 ruo 7 June 2014. Mgbe ahụ, el-Sisi meriri ntuli aka onye isi ala nke e mere emesịa, wee ṅụọ iyi nke ọrụ na 8 June 2014.
Ebubo nrụrụ aka
dezieOtu onye Ijipt bụbu onye ọrụ nkwekọrịta agha, Mohamed Ali, boro ebubo na Entissar Amer bụ akụkụ nke "nrụrụ aka zuru oke" metụtara ndị ọrụ agha na ndị ikwu Sisi. Mkpesa n'okporo ámá mere na nzaghachi nye nkwupụta Ali banyere Amer na di ya.[4]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 AfricaNews (2019-06-01). Celebrating African First Ladies: Senegal's Marieme Faye Sall (en). Africanews. Archived from the original on 2019-10-17. Retrieved on 2019-09-18. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name ":0" defined multiple times with different content - ↑ al-Hameed. "Egypt's next first lady? Meet Mrs. Sisi and Mrs. Sabbahi", al-Arabiya, 12 May 2014. Retrieved on 3 April 2018.
- ↑ Egypt’s next First Daughter? Meet Aya al-Sisi
<ref>
tag with name "AJE_27Sep_predictions" defined in <references>
is not used in prior text.