Djeffal Fayçal
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Algeria |
Ebe ọmụmụ | Batna Province |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic |
ọrụ ọ na-arụ | ọkà mmụta sayensị, academic |
onye were ọrụ | University of Batna |
ebe agụmakwụkwọ | Université de Kinshasa |
Ihe nrite | Fellow of the African Academy of Sciences |
Djeffal Fayçal bụ ọkammụta si mba Algeria n'isi ọmụmụ Engineering Technology & Applied Sciences na Mahadum Batna. Ọ bụ onye òtù Arab-German Academy of Sciences and Humanities, onye òtù IEEE, onye òtù African Academy of Sciences na onye na-erite uru na ihe nrite Microsoft TWAS - AAS Award.[1][2][3][4][5]
Agụmakwụkwọ Ya
dezieAmụrụ ya na Batna, mba Algeria n'afọ 1975. O nwetara nzere B.Sc., M.Sc na PhD ya n'isi ọmụmụ Electronics na Mahadum Batna n'afọ 1998, 2001 na 2006 n'otu n'otu.[6][7][2]
Ihe Ntinye Ya na Ngalaba Sayensị
dezieA maara ya maka ntinye ya na mmepe nke ụzọ ọhụrụ eji amụ ngwaọrụ eletrọnịkị nanoscale na sekit. A na-ekwunyere ndị òtù nnyocha ya na ọ bụ ha mepụtara usoro mgbakọ dị nro nke akwụkwọ akụkọ (netwọk akwara ozi, algọridim mkpụrụ ndụ ihe nketa, particle-swarm computations, neural-space mapping, fuzzy logic, na ndị ọkachamara sistem) maka imewe nke ngwá electronic nanoscale dị iche iche. [4][1]
Ọrụ Dịka onye gụrụ akwụkwọ Ya
dezieỌ sonyere na Mahadum Batna n'afọ 2003 ebe ọ ghọrọ osote ọkammụta n'afọ 2007. N'afọ 2012 ọ ghọrọ onye osote ọkammụta, ma n'afọ 2020 ọ ghọrọ ọkammụta zuru ezu.[5][1]
Mmekọrịta Ya na Òtù Ndị O Sogasị na Ha
dezieỌ bụ onye òtù Kansụl Sayensị na Institute of Electronics, International Association of Engineers na European Materials Research Society. Ọ bụkwa onye òtù Arab-German Academy of Sciences and Humanities, onye òtù dị n'okorọbịa nke The World Academy of Science Na onye òtù dị elu nke IEEE.[1][5]
Ihe Nrite na Nkwanye ùgwù Ya
dezieỌ nwetara ihe nrite Shoman maka ndị nyocha Arab - Science n'afọ 2011, na onyinye Microsoft-TWAS-AAS n'afọ 2010.[1]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 aasciences.africa/fellow/djeffal-faycal Djeffal Fayçal | The AAS.
- ↑ 2.0 2.1 Fayçal Djeffal_ECC 2021 - Engii. Archived from the original on 2022-11-21. Retrieved on 2023-12-09.
- ↑ Templeeti:Cite webụ
- ↑ 4.0 4.1 [https:/ /www.microsoft.com/en-us/research/blog/microsoft-research-and-twas-aas-recognize-outstanding-young-african-scientists/ Microsoft Research na TWAS-AAS Na-amata Ndị Na-eto Eto Na-ahụ Maka Sayensị Sayensị Afrịka pụtara ìhè] (en-US) (2011-03-28).
- ↑ 5.0 5.1 5.2 Fayçal Djeffal (en-us).
- ↑ Templeeti:Cite webụ
- ↑ Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified.