Dahmane El Harrachi
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Algeria, France |
aha n'asụsụ obodo | دحمان الحراشي |
ụbọchị ọmụmụ ya | 7 Julaị 1926 |
Ebe ọmụmụ | El Biar |
Ụbọchị ọnwụ ya | 31 Ọgọọst 1980 |
Ebe ọ nwụrụ | Aïn Bénian |
ihe kpatara ọnwụ | traffic collision |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic |
ọrụ ọ na-arụ | onye na-abụ abụ, odee egwu |
ụdị ọrụ ya | Algerian chaabi |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1956 |
ngwa egwu | olu egwụ |
onye nlereranya | Andalusi classical music |
onye nnọchite anya nwebiisinka | SACEM |
ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
Dahmane El Harrachi (aha ya bụ Abderrahmane Amrani), (July 7, 1926 na August 31, 1980), bụ onye Algeria Chaâbi na-agụ egwu nke Chaoui. Abụ ya Ya Rayah mere ka ọ bụrụ onye kacha mma na-agu egwu Chaabi nke a tụgharịrị egwu ya n'asụsụ ndị ọzọ.[1]
Ọ kwagara France na 1949 na-ebi na Lille, mgbe ahụ Marseille, tupu o mechaa biri na Paris. Ọ bụ na Paris ebe o meere onwe ya aha, na-agu egwu n'ọtụtụ ebe oriri Algeria n'ebe ahụ.
Onwe
dezieNna ya, onye sitere n'obodo Chaoui nke Djellal na mpaghara Khenchla, bụ muezzin na ụlọ alakụba Djamaa el Kebir na Algiers.
N'afọ 2009, nwa ya nwoke Kamel El Harrachi wepụtara CD otuto nye nna ya, nke akpọrọ "Ghana Fenou".
Mmetụta
dezieEgwú El Harrachi wetara mmetụta nke oge a na châabi, na-etinye isiokwu dị ka ọgụ ndị mbịarambịa na agụụ maka ala nna ya n'ime abụ ya, nke o dere ihe karịrị narị ise.[2] Ọ bụ ihe na-akpali otu ọgbọ nke ndị na-ese ihe na France, gụnyere Rachid Taha.[3]
Ọnwụ
dezieỌ nwụrụ n'abalị iri atọ na otu n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1980 n'ihe mberede ụgbọala n'okporo ụzọ awara awara dị na Algiers. E liri ya n'ebe olili ozu El Kettar.
Ebensidee
dezie- ↑ Zerarka (31 Aug 2015). Dahmane El Harrachi, "toujours vivant", 35 ans après la mort (fr). Al Huffington Post.
- ↑ L'Expression: Culture - Dahmane El Harrachi, l'artiste qui n'est jamais parti (fr-dz). L'Expression. Retrieved on 2020-11-09.
- ↑ Pareles. "Rachid Taha, 59, Algerian Rocker Who Spoke for Immigrants, Dies (Published 2018)", The New York Times, 2018-09-14. Retrieved on 2020-11-09. (in en-US)