Comfort Momoh
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịObodoézè Nà Ofú Dezie
Aha enyereComfort, Iyabo Dezie
aha ezinụlọ yaMomoh, Amah Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1962 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
Ọrụ ọ na-arụmidwife, nurse Dezie
onye were ọrụGuy's and St Thomas' NHS Foundation Trust Dezie
ebe agụmakwụkwọKing's College London Dezie
Nsokuye nsọpụrụOnye otu Order nke Alaeze Ukwu Britain Dezie
Ihe nriteOnye otu Order nke Alaeze Ukwu Britain Dezie
in opposition toIbe nwaanyị ugwu Dezie

Comfort Iyabo Amah Momoh, MBE (a mụrụ n'afọ 1962) bu onye na-enyere ndị dị ime aka ị mụpụta nwa nke bu onye okachamara na ọgwọgwọ nke ndi nwanyi e bere ugwu. A mụrụ ya na Naijiria,ma Momoh bụ onye otu ndi Britain FGM national clinical group,e guzobere n'afọ 2007 iji zụọ ndi okachamara banyere otu esi a rụ ọrụ ahụ. [1] Ruo afọ 2017, ọ rụrụ ọrụ dị ka ọkachamara ahụike ọha na eze na Guy and St Thomas 'NHS Foundation Trust na Lọndọn. [2] Ọ bụ onye nchịkọta akụkọ nke Female Genital Mutilation (2005).

Mmalite ndụ ya na mmuta dezie

A mụrụ Momoh na Legos,na Naijiria,n'ezinụlọ ndị Naijiria na Gana. [3] [4] Nne nne ya nwụrụ ụbọchị ole na ole tupu ọmụmụ Momoh, ọ kachasị bụrụ nne nna ya zụlitere ya. [5]

N'afọ 1981, ọ kwagara UK maka ọ zụzụ ị bụ nọọsụ na North Middlesex Hospital. Ọ bụ na Middlesex ka ọ malitere ị mụ banyere FGM, nke ndị agbụrụ ya anaghị eme na Naijiria. [3] N'afọ 2002,o nwetara nzere bachelọ na nlekọta ahụike ụmụ nwanyị site na Florence Nightingale School of Nursing and Midwifery,nke King's College dị na Lọndọn . [6] Ọ natara agụmakwụkwọ n'efu nke Florence Nightingale Foundation n'afọ 2007 i ji mee nnyocha banyere ibi nwanyi ugwu n'Afrịka, [7] yana n’afọ 2015 otu ahụ nyere ya njem mmụta n'efu i ji gaa Amerịka i ji mụọ ụzọ ha si e so i bi nwanyi ugwu. [5]

Ọrụ dezie

N’afọ 1997, Momoh guzobere ụlọọgwụ African Well Women Clinic na St Thomas’s Hospital, nke ewepụtara maka ilekọta ụmụ nwanyị i bi ugwu metụtara. [6] [8] N'ime afọ 2013, ụlọọgwụ ahụ na-eleta ihe dị ka ụmụ nwanyị 300 kwa afọ ma na-arụ ọrụ defibuleshọn abụọ kwa izu ụka, nke gụnyere ịmepe ikpu e mechiri n'ihi i be ugwu nke Type III . [9]

Momoh rụtụrụ ọrụ dịka onye ndụmọdụ na World Health Organisation n'afọ 1999 were nọchite anya UK na United Nations Commission on the Status of Women n'afọ 2001. [7] Site n'afọ 2007, ọ rụrụ ọrụ dị ka ọkachamara n'ahụike ọha na eze na Guy's and St Thomas 'NHS Foundation Trust, tupu ị la ezumike nká n'afọ 2017. [2] [10] Momoh nwekwazị Global Comfort Ltd., ụlọ ọrụ ndụmọdụ. [11] A gụnyere ya na ndepụta nke London Evening Standard nke afọ 2014 nke mmadụ1000 kasị nwee mmetụta na Lọndọn. [12]

Nrite dezie

Na 2008 New Year Honours, a họpụtara Momoh ka ọ bụrụ <a href="https://en.wikipedia.org/wiki/Member_of_the_Order_of_the_British_Empire" rel="mw:ExtLink" title="Member of the Order of the British Empire" class="mw-redirect cx-link" data-linkid="83">Member of the Order of the British Empire</a> (MBE) maka ọrụ nlekọta ahụike ụmụ nwanyị. [13] E nyere ya nzere dọktọreti na Mahadum nke Middlesex n'afọ 2008. N’afọ 2011, o ritere ihe nrite ‘Gathering of Africa’s Best (GAB). [14] King's College London họpụtara ya dị ka 2015 Alumna of the Year , [15] ma n'afọ 2016, e nyere ya mkpakọrịta site na Royal College of Midwives . [16]

Mkpesa afọ 2017 dezie

Na Septemba afọ 2017, BBC Newsnight welitere ajụjụ gbasara nnyocha o pekata mpe ụmụaka ise site n'aka Momoh. Ihe omume a nyochara ibu ndi isi ochichi Briten nyere banyere i nyocha umuaka nwanyị maka ibi nwanyi ugwu na ebubo n'ule a mere ka obi ghara iru umuaka a ala n'ihi na-ebibeghi ha ugwu. Ezinaụlọ dị iche iche na-atụ ụjọ na a ga-ebo ha ebubo ma kewaa. Kemgbe afọ 2012, Royal College of Paediatrics and Child Health chọrọ ka ndị dibia bekee na-enyocha ụmụaka e metọrọ bụrụ ndị ọpụrụiche. Newsnight kwuru na Momoh kọwara onwe ya ka "Dọkịnta", agbanyeghị na dọktọreti ya bụ nke onyinye nsọpụrụ, na n'oge ikpe ụlọ ikpe n'afọ 2014, onye ọka ikpe, James Munby, katọrọ ihe akaebe ya dị ka ihe apụghị ịtụkwasị obi. [2] [17] Momoh zara na o nweghị ihe ọjọọ o mere na o nweghi ihe ọ bụla ọ na-ezo. Nimco Ali, onye na-emegide FGM, gwara Times, "Comfort a rụọla ọrụ i ji kwụsị i bi ugwu ihe karịrị afọ 30 ma mee ka ndụ ọtụtụ ụmụ nwanyị na ụmụaka nwanyị baa ọgaranya. Mgbalị iji gbuo atụmatụ ụdịrị nwanyị dị otu a bụ ihe ihere. ” [18]

Ọrụ ahọpụtara dezie

Nrụtụaka dezie

  1. "Our Team", FGM National Clinical Group.
  2. 2.0 2.1 2.2 "Questions raised about prominent FGM campaigner", BBC News, 5 September 2017.
  3. 3.0 3.1 "‘Girls born here can say no to being cut — so families are doing it to them as babies’", London Evening Standard, 6 March 2013.
  4. Miriam Dalli, "Maltese doctors facing up to reality of female circumcision in pregnant refugees", Malta Today, 28 July 2010.
  5. 5.0 5.1 "Influencing Practice Locally, Nationally and Internationally", Florence Nightingale Foundation Alumni Association Magazine, 2, Autumn/Winter 2015, p. 6.
  6. 6.0 6.1 "Comfort Momoh: a carer and campaigner", King's College London, December 2014.
  7. 7.0 7.1 Comfort Momoh lecture series. Archived from the original on 2011-03-10. Retrieved on 2020-11-11.
  8. "Top women named as health inspirations", Guy's and St Thomas' NHS Foundation Trust, 10 July 2014.
  9. Jess Frampton (18 June 2013). From taboo to talking point – an eye-opening insight into Female Genital Mutilation. UN Women. Archived from the original on 27 October 2014. Retrieved on 11 November 2020.
  10. Female genital mutilation (FGM) clinic at Guy's and St Thomas'. Guy's and St Thomas' NHS Foundation Trust (March 2015).
  11. "About us", Global Comfort.
  12. "London's stars are a global force for good", London Evening Standard. Archived 21 October 2014.
  13. Suzi Dixon, "Health and beauty: New Year Honours", The Daily Telegraph, 31 December 2007.
  14. "GAB-Awards-winning midwife honoured for FGM work", Trumpet Media Group, 27 July 2016.
  15. "Dr Comfort Momoh, King’s Alumna of the Year 2015", King's College London, December 2015.
  16. "London midwife receives national midwifery honour for FGM work", Royal College of Midwives, 27 July 2016.
  17. "'I knew my children hadn't had FGM'", BBC Newsnight, 5 September 2017.
  18. Lucy Bannerman, "FGM campaigner Comfort Momoh hits back at attack on her qualifications", The Times, 6 September 2017.

Ọgụgụ ọzọ dezie