Christy Obekpa
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha enyere | Christy |
ụbọchị ọmụmụ ya | 15 Disemba 1971 |
Ebe ọmụmụ | Naijiria |
Asụsụ obodo | Asụ̀sụ̀ Ìgbò |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụ̀sụ̀ Ìgbò, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | judoka |
ụdị egwuregwu | judo |
Christy Obekpa bụzị Oriakụ Aremu (A mụrụ n'ụbọchị nke 15 n'ọnwa Disemba afọ 1971) bụ onye Najiria na-eme egwuruegwu judoka, onye so sọọ mpi na katigori ọkara nke ndi oke ibu nke ụmụ nwanyị. O ritere ọla nchara n'afo1990 n'emume egwuruegwu Judo nke ndi Commonwealth na ọla ọcha na CW Judo Championship n'afo 1992. Oriakụ Aremu bụ nwaanyị mbu Naịjirịa ritere ola n'ihe emume egwuruegwu Judo. O ritekwara ola nchara abuo na 1999 n'emume All-African Games na otu ola nchara n'emume African Judo Championships n'afo 2000. [1]
Ọrụ egwuregwu
dezieN'afo 1990, na Commonwealth Judo Championship nke e mere na Auckland, New Zealand, o sonyere na ihe omume nke 72kg ebe o ritere ọla nchara. [2] Na 1992 Commonwealth Judo Championships nke e mere na Cardiff, Wales, o sonyekwara ma ritekwa ọla ọcha na ihe omume 72kg. [3]
N'egwuruegwu All-Africa Games nke afo 1999 na Johannesburg, Obekpa sonyere n'emume nke 78kg na Open, ebe o ritere ola nchara abụọ. [4]
N'egwuruegwu African Judo Championship nke afo 2000 e mere na Algiers, Algeria, Obekpa ritere ọla nchara n'ihe omume nke 78kg. O sokwara n'emume Open were gbaa onye nke asaa. [5]
Ebemsidee
dezie- ↑ Christy Obekpa, Judoka, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.
- ↑ Commonwealth Games Auckland, Event, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.
- ↑ Commonwealth Championships Cardiff, Event, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.
- ↑ African Games Johannesburg, Event, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.
- ↑ African Championships Algier, Event, JudoInside. www.judoinside.com. Retrieved on 2020-11-20.