Choro Mbenga
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịThe Gambia Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya20. century Dezie
Ebe ọmụmụThe Gambia Dezie
Ọrụ ọ na-arụassociation football coach, Onye otu egwuregwu bọọlụ Dezie
ụdị egwuregwuFootbọl Dezie

Choro Mbenga bụ onye Gambia na-azụ bọọlụ na onye bụbu onye egwuregwu, onye bụ onye njikwa nke otu Gambia Red Scorpions FC [de], na onye na-enyere onye nchịkwa nke otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị nke Gambia aka.

Onye nke ya dezie

Nwanne Choro Mbenga bụ Des Samba bụ onye nkuzi na onye njikwa na Red Scorpions FC [de], ma mesịa bụrụ onye isi bọọlụ ụmụ nwanyị maka Gambia Football Association (nke bụ Gambia Football Federation ugbu a) maka oge abụọ na-abụghị n'usoro.[1][2]

Ọrụ dezie

Mbenga gbara bọọlụ maka otu Gambia Red Scorpions FC dị ka onye na-edebe goolu.[3] N'afọ 2011, Mbenga kwadoro usoro nkuzi bọọlụ ụmụ nwanyị nke Confederation of African Football na Addis Ababa, Ethiopia.[4] Site na afọ 2014 ruo 15, ọ bụ onye nhazi bọọlụ ụmụ nwanyị nke Gambia Football Federation.[5][6] Mgbe ọ nọ n'ọrụ ahụ, ọ haziri mmemme bọọlụ ụmụ nwanyị mbụ na Gambia, maka ụmụ agbọghọ dị n'agbata afọ 6 na 12 na Yundum.[7]

Mbenga rụrụ ọrụ dị ka onye isi nchịkwa nke Red Scorpions FC, yana dịka onye na-enyere onye nchịkwa nke otu egwuregwu bọọlụ ụmụ nwanyị nke Gambia aka, na otu egwuregwu bọlụ ụmụ nwanyị na-erubeghị afọ iri na asaa nke Gambia.[8][3][9] Ọ bụ naanị nwanyị Gambia nwere ikikere FIFA B.[3] O duuru Red Scorpians gaa n'ọnọdụ nke abụọ na 2009 Division One League Championship.[10] N'afọ 2016, a kwụsịtụrụ Mbenga na onye na-enyere ya aka Dodou Faye maka ịwakpo onye nnọchiteanya.[11] Ọ bụ onye nkuzi nke onye na-agba bọọlụ Gambia na Red Scorpians Fatim Jawara, onye nwụrụ na afọ 2016 mgbe ọ nwara ịgafe Oké Osimiri Mediterenian.[8] Mbenga duziri Red Scorpions na afọ 2019 Division One League Championship.[12]

Ihe odide dezie

  1. "GFA Female Football Gets New Chairman", Africa.gm, 27 January 2009. Retrieved on 4 January 2021.
  2. "GFF Regional Elections Update", Standard.gm, 2 May 2017. Retrieved on 4 January 2020.
  3. 3.0 3.1 3.2 Eine deutsche Trainerin auf Mission in Gambia (de). Deutschlandfunk Kultur (12 July 2020). Retrieved on 4 January 2021.
  4. "Gambian football coach set for CAF coaching course in Addis Ababa", The Point, 23 May 2011. Retrieved on 4 January 2021.
  5. "Choro Mbenga Resigns", Standard.gm, 30 April 2015. Retrieved on 4 January 2021.
  6. "Gambia: Choro Mbenga Dismisses GFF Presidential Aspirations", The Daily Observer, 22 August 2014. Retrieved on 4 January 2021.
  7. Gambia FA leads initiative to promote girls' participation in football. Fare Net (30 December 2014). Retrieved on 4 January 2021.
  8. 8.0 8.1 "After soccer star risked all for Europe, Gambia still wrestles with why she left", The Christian Science Monitor, 27 December 2017. Retrieved on 4 January 2021.
  9. "Gambia: Choro Mbenga Thanks Fans for Their Support", The Daily Observer, 3 April 2012. Retrieved on 4 January 2021.
  10. "Choro Mbenga: Crouch's Departure a Big Loss", The Point, 20 January 2010. Retrieved on 4 January 2021.
  11. "GFF suspends players and officials", The Point, 16 May 2016. Retrieved on 4 January 2021.
  12. "Red Scorpions Take Female Title", Standard.gm, 4 April 2019. Retrieved on 21 October 2021.