Bisi Silva
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha n'asụsụ obodo | Bisi Silva |
Aha ọmụmụ | Olabisi Obafunke Silva |
aha enyere | Olabisi, Q106368328 |
aha ezinụlọ ya | Silva |
ụbọchị ọmụmụ ya | 29 Mee 1962 |
Ụbọchị ọnwụ ya | 12 Febụwarị 2019 |
Ebe ọ nwụrụ | Lagos |
ihe kpatara ọnwụ | Kansa ara |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | archivist, exhibition curator, art critic |
ụdị ọrụ ya | exhibition curation, art criticism, ǹkà |
onye hiwere | Centre for Contemporary Art |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Bisi Silva ( Olabisi Obafunke Silva ) (29 Mee 1962 - 12 Febụwarị 2019) [1] bụbu onye nlekọta nka nke ala Naijiria bibu na Legos .
Ndu ya
dezieBisi Silva gụrụ akwụkwọ nzere mast na Visual Arts Administration: Curating and Commissionering Contemporary Art na Royal College of Art,dị na Lọndọn, n'afọ 1996. Na mbido ụbọchị nke ọrụ ya, Silva rụrụ ọrụ dị ka onye nlekọta nka nke onwe ya ma guzobe Fourth Dial Art, ụlọ ọrụ na-achọghị uru na Lọndọn nke a raara nye ịkwalite na ịzụlite omume ọdịnala na nka anya, yana iji nyere ndị na-ese ihe aka ị mekọrịta mmekọrịta bara uru n'ụlọ ọrụ nka na ndị ọkachamara. Otu n'ime ihe ndị pụtra na nhiwe nke Fourth Dial Art bụ ihe ngosi njem, Ndị isi ala, nke gosipụtara ọrụ nke Faisal Abdu'Allah, onye bụ onye na-ese ihe nkiri pụtara mgbe ahụ ụwa ise ihe nke Lọndọn.
Ọ gara Legọs,na Nigeria n'afọ 1999 na ebumnuche nke ị malite ọrụ ebe ahụ. [2] Silva bụ onye guzobere na onye ntụzi aka nka nke Center for Contemporary Art, Lagos (CCA, Lagos), nke mepere n'ọnwa Disemba n'afọ 2007. CCA Lagos na-akwalite nnyocha, ndetu na ngosipụta metụtara nka n'Afrịka na mba ofesi. Na CCA, Lagos, Silva lekọtra ọtụtụ ihe ngosi, gụnyere nke ya na onye eserese Naịjirịa bụ Ndidi Dike . Silva bụkwa onye guzobere Asiko Art School, nke na-akọwa onwe ya dị ka "part art workshop, part residency, and part art academy" [3]
Ọ bụ onye na-ahụ maka The Progress of Love, mmekọrịta dị n'etiti mpaghara atọ n'Amerịka na Naijiria (Ọktoba 2012) - Jenụwarị 2013). Silva bụ onye na-elekọta JD 'Okhai Ojeikere : Moments of Beauty, Kiasma, Helsinki (Eprel - Nọvemba 2011). Ọ bụkwa onye rụkọrọ ọrụ nlekota ọnụ maka nke agba nke abụọ nke Thessaloniki Biennale of Contemporary Art, Greece, Praxis: Art in Times of Uncertainty n'ọnwa Septemba n'afọ 2009. N'afọ 2006, Silva bụ otu n'ime ndị na-elekọta Dakar Biennale na Senegal. Na mmekorita ya na onye nnyyocha si Portugal bụ Isabel Carlos, ọ họpụtara ndị na-ese ihe maka ihe nrite Artes Mundi agba nke atọ na Wales . O lekọtara Contact Zone: Contemporary Art from West and North Africa (Ọktoba 2007) na ihe ngosi akpọrọ Telling ... Contemporary Finnish photography, in the Seventh Biennial of African Photography na Bamako (Nọvemba 2007).
Silva dere na nka dị ugbua maka mbipụta mba ụwa, gụnyere Art Monthly, Untitled, Third Text, M Metropolis, Agufon na maka akwụkwọ akụkọ Naịjirịa dịka This Day . Ọ nọ na ngalaba nchịkọta akụkọ nke n.paradoxa, akwụkwọ akụkọ gbasara ndị nwanyị na mba ụwa, ọ bụkwa onye nchịkọta akụkọ ọbịa maka okwu Afrịka na ndị Afrịka mba ụwa nke n.paradoxa (Jenụwarị 2013).
Silva nwụrụ na Legos,dị na Naijiria, mgbe ọ dị afọ iri ise na isii ka ya na ọrịa kansa ara lụrụ ọgụ afọ anọ.
Ndị na-ahụ maka ọrụ Nina Zimmer na Touria El Glaoui kpọrọ aha Silva n'etiti ndị na-elekọta nka kachasị metụta ndụ ndị mmadụ n'afọ iri. [4]
Ngosipụta ọ haziri ma ọ bụ soro hazie
dezie2009
dezie- In the Light of Play, Durban Art Gallery and Johannesburg Art Fair
- Chance Encounters, Seven Contemporary Artists from Africa, Sakshi Gallery, Mumbai India e Sakshi Gallery, Taipei, Taiwan
- Like A Virgin ..., Lucy Azubuike (NIG) and Zanele Muholi (SA), CCA, Lagos
- Praxis: Art in Times of Uncertainty, Second Thessaloniki Biennale of Contemporary Art, Greece
- Maputo: A tale of One City, Oslo, part of the Africa in Oslo season.
2008
dezie- George Osodi, Paradise Lost: Revisiting the Niger Delta, CCA, Lagos
- Ndidi Dike, Waka-into-bondage: The Last ¾ Mile, CCA, Lagos
2007
dezie- Fela, Ghariokwu Lemi and The Art of the Album Cover, CCA, Lagos
- Contact Zone: Contemporary Art from West and North Africa, National Museum of Mali
- Telling... Contemporary Finnish photography, Settima Biennale di Fotografia Africana, Bamako
2006
dezie- Dak'Art, Biennale di Dakar, Senegal
Akwụkwọ
dezie- Jayne O. Ifekwunigwe: Mixed Race Studies: A Reader — Routledge, 2004. Templeeti:ISBN
Ebem si dee
dezie- ↑ Sandomir, Richard (25 February 2019). Bisi Silva, 56, Bold Curator of Contemporary African Art, Dies. Retrieved on 25 February 2019.
- ↑ Moses, Serubiri. Bisi Silva: time remembered.
- ↑ Greenberger, Alex. Bisi Silva, Founding Artistic Director of Center for Contemporary Art, Lagos, Has Died at 57.
- ↑ Who Was the Most Influential Curator of the Decade? Dozens of Art-World Experts Told Us Their Judgment, and Why (en-US). Artnet News (2019-12-24). Retrieved on 2019-12-29.
Njikọ dị na mpụga
dezie- Bisi Silva's blog
- Ogige maka Contemporary Art, Lagos
- Bisi Silva na powerofculture.nl
- Bisi Silva Obituary On NaijaGists.com
- Bisi Silva Obituary, Artforum, 12 Maachị 2019
- Bisi Silva chetara na Aperture. 1 Feb 2019
- Na weebụsaịtị AICA, UK
- Na Art Throb, South Africa
- Na Mba Africa
- Lọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ọzụzụ nke Afrika
- Art Africa Magazine
- Oge a na ụtụ
- Nigerian Tribune
- Jumoke Sanwo Bisi Silva 1962–2019 African Arts: The MIT Press Mpịakọta 52, Nọmba 4, Oge oyi 2019
- Na Memoriam: Okwui Enwezor na Bisi Silva