Bibi Bakare-Yusuf

Ọkà mmụta Naijiria, onye ode akwụkwọ na onye nchịkọta akụkọ si Lagos, Nigeria
Bibi Bakare-Yusuf
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1970 Dezie
Ebe ọmụmụLagos Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụacademic, Odee akwụkwọ, onye nchikota akuko, Onye nkwusa Dezie
ebe agụmakwụkwọGoldsmiths, University of London, University of Warwick Dezie
ogo mmụtabachelor's degree, nzere masters, Doctor of Philosophy Dezie
Ihe nriteOkayAfrica 100 Women Dezie

Bibi Bakare-Yusuf (onye a mụrụ n'afọ 1970) bụ onye Nigerian na-ede ederede ma na-enyocha ma na ahazi ederede ndi ọzọ, ọ nọ na Lagos, Nigeria. Ya na onye otu ya bụ Jeremy Weate bidoro ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ a kpọrọ Cassava Republic Press di n'Abuja n'afọ 2006. Uche ha bụ ime ka ọdịri onye ọbụla mfe ibipụta akwụkwọ tụmadị ndi Africa ka na ebido ebido,ọzọkwa ha chọrọ ka ọ bụrụ ebe a ga na-ebipụta akwụkwọ ndị Afrika dere bụ ndi nke a ga na-eto na mba Europe na America.

Mbido ndụ na agụmakwụkwọ dezie

A mụrụ Bibi Bakare-Yusuf na Lagos, Nigeria mana ọ kwagara England mgbe ọ dị afọ iri na atọ, ọ gụrụ akwụkwọ na Goldsmith College, Mahadum nke London ebe ọ gụrụ akwụkwọ Nkwukọrịta na Anthropology ma mee PhD na Gender Studies site na Mahadum Warwick . [1] [2]

Ọrụ na Nkepụta Cassava Press dezie

N'afọ 2006, Bibi Bakare-Yusuf - onye bụ onye gụrụ akwụkwọ na UK na Nigeria na onye otu ya Jeremy Weate, [3] guzobere ụlọ ọrụ iji mepụta akwụkwọ ezigbo akwụkwọ ọgụgụ iduazi nke Africa nke ọnụ ego ya ga ekwe ndị mmadụ gote ma nye ha obi ụtọ. [4] Ha enweghị ọzụzụ/mmụta banyere ahịa akwụkwọ maọbụ mmbịpụta akwụkwọ ''naanị masị iji hụ na-edepụtara akụkọ ndị Afrika ndị Afrika nwee. Ndị ọkachaa mara n'ihe gbasara mbipụta akwụkwọ dịka Margaret Busby, otu na ndị guzobere Allison & Busby, bu ndị ndu anyị ", dịka Bakare-Yusuf chetara:

"Mgbe m kwagara Naịjirịa dịka onye nwere agụmakwụkwọ, e nwere ndị ode akukọ nke Afrika ana-ebipụta n'obodo oyibo bụ ndị anaghị ahụ ebe a, M wee kpebie ibido ụlọ ọrụ mbipụta akwụkwọ a kpọrọ Cassava Republic Press. Amaghị ihe ọbụla gbasara mbipụta akwụkwọ. Ama m maka odide na ọgụgụnbụ ndịedemede Africa a niile na-atọ ụtọ ka a na-ebipụta na mba ọzọ, na ha anaghị adị na mpaghara. . . . N'ihi ya, ekpebiri m, 'dịkwa mma, aga m amalite ụlọ ọrụ na-ebipụta akwụkwọ'. Cassava Republic Press. Amaghị m ihe ọ bụla, ọ dịghị ihe ọ bụla ọ bụla, banyere mbipụta! Amaara m ihe niile banyere ịgụ na ide, mana ọ nweghị ihe gbasara azụmahịa nke mbipụta. Nde mmadụ 150. 77 nde n'ime ha bụ ndị na-eto eto n'okpuru 30. Kedu ka anyị ga-esi mee ka ndị ahụ na-agụ ihe? Ndi ahu bu ndi m nwere mmasi igbanwe. Anyị chọrọ ịgbanwe obi. Anyi choro ime ka ha jua ajuju maka ndi ha bu, ma juo ndi mmadu ajuju. " [5]

  1. Bibi Bakare-Yusuf (de). comics-berlin.de. Archived from the original on 2021-04-19. Retrieved on 2021-04-19.
  2. Mark Piesing, "Nigeria's Bibi Bakare-Yusuf: 'Our Brand Is Growing'", Publishing Perspectives, 6 December 2016.
  3. Belinda Otas and Tolu Ogunlesi, "Feeding the African Imagination: Nigeria’s Cassava Republic", Publishing Perspectives, 27 April 2010.
  4. Sumaila Umaisha, "Rebuilding the reading and writing culture (interview)", New Nigerian, 17 May 2008.
  5. Jennifer, "A Renewed Interest in Literature from Africa: Trailblazer Cassava Republic Press to Launch in the United Kingdom", Books Live, 25 November 2015.