Babagana Umara Zulum
A mụrụ Zulum na mkpụrụ ụbọchị iri abụo na ise nke ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1969, na okpúru ọchịchị ime obodo nke Mafa dị naBorno Steeti . [1]
Agụmakwụkwọ
dezieMgbe ọ gụsịrị akwụkwọ elementrị na ụlọ akwụkwọ nta Mafa, site n'afọ 1975 ruo 1980 na agụmakwụkwọ sekọndrị na ụlọ akwụkwọ sekondiri nke Gọmenti, Monguno site n'afọ 1980 ruo 1985, Zulum gụrụ akwụkwọ na Mahadum nke Maiduguri, [2] ebe ọ nwetara akara ugo mmụta na Injinia Ọrụ Ugbo. Mgbe nke ahụ gasịrị ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu ndị ntorobịa na Politekinik dị na Katsina Steeti. [1] Ọ gara Mahadum Ibadan site n'afọ 1997 ruo 1998, ebe ọ nwetara nzere masta na Injinia Ọrụ Ugbo. N'afọ 2005, ọ debanyere aha maka PhD na Injinia Ala na Mmiri na Mahadum Maiduguri nke ọ gụsịrị n'afọ 2009.[1][3]
Ọrụ
dezieNhọpụta mbụ Babagana bụ n'afọ 1989 n'ọrụ obodo nke Borno Steeti dị ka onye enyemaka teknụzụ na Ministrị nke ọrụ ugbo nke steeti ahụ.[1] N'afọ 1990, Babagana kwagara na njikota ọrụ ímé obodo Gọmentị nke Borno Steeti dị ka nnukwu onyé nnelu anya n'ọrụ, mgbe e mesịrị, ọ bụrụ onyeisi Inginia mmiri. N'afọ 2000, ọ natara ọrụ na Mahadum Maiduguri dị ka onye na-enyere onye nkuzi aka ebe ọ rịgooro n'ọkwa Prọfesọ. Babagana bụ Osote Dean na Onye n' arụ òlụ dịka Dean, ngalaba nke Inginia n'afọ 2010 na 2011 n'otu n'otu. N'afọ 2011, a họpụtara Babagana Umara ka ọ bụrụ Rektọr nke Politekinik. Ka ọ dịgodị, ọ nọgidere n'ọkwa nkuzi ya na Mahadum Maiduguri . [1] N'afọ 2015, Gọvanọ Kashim Shetima nke Borno Steeti mere ya Kọmishọna nke Nhazighari, Ndozigharị nakwa Ndozigharị, ọkwá ọ nọrọ ruo n'afọ 2018.[4]
Akwụkwọ ndị e bipụtara
deziePrọfesọ, Babagana Zulum edeela akwụkwọ na edemede maka mbipụta na akwụkwọ akụkọ obodo na nke mba ụwa, na mpaghara nke Injinia Ọrụ Ugbo.
ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieN'abalị mbụ nke ọnwa Ọktoba n'afọ 2018, ọ meriri na ntuli aka gọvanọ nke All otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị Progressives Congress maka Borno Steeti.[5] A họpụtara ya ka ọ bụrụ gọvanọ nke Borno Steeti na ntuli aka gọvanọ Borno nke afọ 2019 nke e mere na abalị iteghete nke ọnwa Machị afọ 2019, na votu dị òtù nde, otu puku narị iri asaa na ise, narị anọ na iri anọ. [6][7][8]
Mgbalị igbu ọchụ
dezieZulum abụrugo onye ndị otu Boko Haram gbara mbọ igbu ọtụtụ ugboro.
Ndị Boko Haram wakporo ndị njem ya na abalị iri abụo na iteghete nke ọnwa Julaị afọ 2020, n'okporo ụzọ Maiduguri gawaraDamaturu . Egburu mmadụ ise gụnyere ndị uwe ojii atọ. [9]
Na abalị iri abụo na isii nke ọnwa Septemba afọ 2020, ndị Boko Haram wakporo Zulum na ndị agha ya ọzọ n'akụkụ ọdọ mmiri Chad . Opekata mpe, ya bụrụ mmadụ iri na asatọ ka a kọrọ na e gburu, gụnyere ndị uwe ojii na ndị agha iri na anọ, ndị nkịtị anọ. [10] E mechara kwalite ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ ka ọrụ iri atọ dika achọtara ozu ndị ọzọ. [11]
Ụbọchị atọ ka e mesịrị, na abalị iri abụo nà iteghete, ìgwè ndị njem Zulum hụrụ otu ịnyịnya ibu n'okporo ụzọ wee gbaa ya. Mgbe inyinya ibu ahụ gbawara, ndị omekome si ebe zoro ezo ha nọ wee gbaba ha. Egburu ọtụtụ ndị nnupụisi, ebe o nweghị onye nọ n’ime convoy ahụ merụrụ ahụ. [10]
Na abalị iri abụo na abụọ nke ọnwa Nọvemba afọ 2020, a wakporo convoy nke Zulum mgbe ọ na-eme njem izute ndị ọrụ gọọmentị na Baga. Egburu ndị agha asaa na ndị nkịtị abụọ n’obere nke a, mana agbataghị gọvanọ ahụ. [12]
Hụkwa
dezie- Ndepụta nke ndị gọvanọ nke steeti Borno
Ihe nrite
dezieN' ọnwa Ọctoba afọ 2022, Onye isi ala Muhammadu Buhari nyere ya nsọpụrụ mba Naijiria nke Ịtụ Ọchịagha nke ndị Niger (CON). [13]
Ihe oru ngo
dezieBabagana Zulum, emechaala ma nyekwa ọrụ iri asaa na asaa maka ịnye ọrụ na ahụike, agụmakwụkwọ na akụkụ ndị ọzọ nke akụ na ụba. [14]
Nkesa nke Ihe enyemaka
dezieZulum kwuru na nkesa ihe enyemaka ahụ bụ iji gbapụta obodo ndị a kwụsịrị isi ihe ha ji ebi ndụ n'ihi mwakpo na ihe ndị Boko Haram na-eme. [15]
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 Shettima endorses Prof. Umara-Zulum successor (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2018-09-30). Retrieved on 2019-03-13. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name ":2" defined multiple times with different content - ↑ Profile: Babagana Zulum, Governor, Borno State, Nigeria [2019 –]. Premium Times Nigeria (25 January 2021). Retrieved on 2023-06-02.
- ↑ Error on call to Template:cite web: Parameters url and title must be specified. www.premiumtimesng.com. Retrieved on 2024-06-28.
- ↑ Boko Haram: Borno reconstructs 60% of houses destroyed in Bama – Commissioner (en-US). The Eagle Online (2017-03-28). Retrieved on 2019-03-13.
- ↑ Borno, Nasarawa APC endorse Zulum, Sule (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2018-10-02). Retrieved on 2019-03-13.
- ↑ APC's Zulum wins Borno Gov poll with 1,175,440 votes (en-US). Punch Newspapers (11 March 2019). Retrieved on 2019-03-13.
- ↑ Abubakar (2019-03-11). JUST IN: Zulum wins Borno governorship election (en-GB). Daily Trust. Retrieved on 2019-03-13.
- ↑ Scooper - Nigeria Politics News: Meet The 5 Best Governors In Nigeria. m.scooper.news. Retrieved on 2020-05-28.
- ↑ BREAKING: Boko Haram Attacks Convoy Of Borno Governor, Zulum, In Baga. Sahara Reporters (2020-07-29). Retrieved on 2020-07-29.
- ↑ 10.0 10.1 Nigeria's Boko Haram crisis: 'Bomb on donkey' used to ambush Borno governor, BBC
- ↑ Dozens killed in jihadist attack on Nigeria governor's convoy, France 24
- ↑ Boko Haram Kills Fifteen over Two Days in Borno State (en). Persecution (2020-11-23). Retrieved on 2021-01-10.
- ↑ FULL LIST: 2022 National Honours Award Recipients The Nation Newspaper (en-US) (2022-10-09). Retrieved on 2022-10-31.
- ↑ Nigeria (2023-09-12). Zulum completes 77 projects in education, health, other sectors (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News. Retrieved on 2024-01-27.
- ↑ "25,000 Borno families share Zulum’s N25m".