Ayo Gabriel Irikefe
Chief Ayo Gabriel Irikefe, GCON (3 Machị 1922 - 1 Ọgọst 1996) bụ onye ọka iwu Naijiria na Chief Justice nke Naijiria site na 1985 ruo 1987.[1]
Ayo Gabriel Irikefe | |
---|---|
Chief Justice of Nigeria | |
[[ Ambassador to Templeeti:CountryPrefixThe]] | |
In office Templeeti:En dash range | |
Preceded by | George Sodeinde Sowemimo |
Succeeded by | Mohammed Bello |
Personal details | |
Born | Ikorodu, British Nigeria (now Ikorodu, Lagos State, Nigeria) |
03 Maachị 1922
Died | 1 Ọgọstụ 1996 | (aged 74)
Political party | Non-partisian |
Oge ọ malitere
dezieA mụrụ Irikefe na Machị 1922 n'ezinụlọ Aduwa na Theresa Irikefe. A mụrụ ya na Ikorodu, mpaghara gọọmentị nke Lagos Steeti na ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa. Ọ malitere agụmakwụkwọ ya na ụlọ akwụkwọ CMS dị na Okitipupa, wee gaa St John's School Okitpupa, St Mathews Catholic School, Ode-Ondo na St. Gregory's College, Obalende, Lagos ebe ọ nwetara asambodo ụlọ akwụkwọ West Africa.[2] Ọ gụrụ akwụkwọ na College of Marine Engineering and Communications, Manchester n'etiti 1945 na 1946 tupu o kpebie ịmụ iwu na 1949.
Ọrụ iwu
dezieA kpọrọ ya ka ọ bụrụ onye ọka iwu England na July 1, 1952, n'otu afọ ahụ ka o guzobere ụlọ ọrụ iwu nke ya. Ọ nọ na-arụ ọrụ iwu na Warri site na 1952 ruo 1955. N'afọ 1955, ọ rịgooro n'ọkwa onye ndụmọdụ Crown na mpaghara ọdịda anyanwụ nke Naịjirịa ebe ọ rụrụ ọrụ na Ibadan ma mesịa kwaga obodo Benin. Ọ bụ onye ndụmọdụ na-eduga na kọmitii nke nyochara ọrụ nke òtù nzuzo Owegbe ma mesịa bụrụ onye ọka ikpe na Ụlọikpe Kasị Elu nke Mid-Western Nigeria. N'afọ 1966, ọ ghọrọ Attorney General nke Mid-Western State, ọkwá o nwere ruo mgbe a họpụtara ya n'oche nke Ụlọikpe Kasị Elu nke Naijiria dị ka Onye Ikpe.[3] N'afọ 1985, ọ ghọrọ onye otu Nigerian Body of Benchers, n'otu afọ ahụ ka a họpụtara ya dị ka Chief Justice nke Nigeria iji nọchie George Sodeinde Sowemimo.[4]
Irikefe lara ezumike nká n'afọ 1985 mgbe ọ ruru afọ iri isii na ise.[5][6]
N'afọ 1975, e mere ya onye isi oche nke kọmitii na-ahụ maka ịmepụta steeti na n'afọ 1980, a họpụtara Irikefe ka ọ bụrụ onye isi oche ya na Crude Oil Sales Tribunal iji nyochaa ebubo nke ego efu n'ime ụlọ ọrụ mmanụ Naijiria.
Ihe odide
dezie- ↑ 20 reasons why Nigerians have rejected Buhari since 2003 (31 October 2014).
- ↑ Federal Judicial Service Commission. fjsconline.gov.ng. Archived from the original on 2014-12-03. Retrieved on 26 April 2015.
- ↑ Siollun (2009). Oil, Politics and Violence. ISBN 9780875867106. Retrieved on 26 April 2015.
- ↑ Prosecutorial Powers of the Attorney-General under the Constitution: the Supreme Court erred in law and undermined the Public Interest in The State v Ilori. Sahara Reporters (28 March 2010). Retrieved on 26 April 2015.
- ↑ NIGERIA'S LEADERSHIP: RATION 2:1, ANOTHER FEATHER ON JONATHAN'S CAP. TheNigerianVoice. Retrieved on 26 April 2015.
- ↑ Bamgbose (7 December 2013). Digest of Judgements of the Supreme Court of Nigeria. ISBN 9789788431404. Retrieved on 26 April 2015.