Asụsụ Gun (Gun: ) bụ asụsụ dị n'òtù asụsụ Gbe. Ndị Ogu na-asụ ya na Benin, nakwa na ndịda ọdịda anyanwụ Naịjirịa.[1] Gun bụ akụkụ nke ụyọkọ asụsụ Fon n'ime asụsụ ndị dị n'Ebe Ọwụwa Anyanwụ Gbe; ọ dị nso na Fon, ọkachasị ụdị Agbome na Kpase yana asụsụ Maxi na Weme (Ouémé). A na-eji ya eme ihe n'ụlọ akwụkwọ ụfọdụ na Ngalaba Ouémé nke Benin.[2]

Gun
gungbe
Spoken in: Benin, Nigeria
Total speakers: 1,539,000
Language family: Nnijer–Kongo
 Atlantic–Congo
  Volta-Congo
   Kwa
    Gbe
     Fon
      GunÀtụ:Infobox Language/scriptÀtụ:Infobox Language/official
Language codes
ISO 639-1: none
ISO 639-2:
ISO 639-3: guw

Àtụ:Infobox Language/IPA

Asụsụ Gun
asụsụ, modern language
obere ụdị nkeAsụsụ Gbe Dezie
akara alaGungbe Dezie
mba/obodoBenin, Naijiria Dezie
ụmụ amaala kaOuémé Department, Plateau Department, Federal Capital Territory (Nigeria), Ȯra Lagos, Ȯra Ogun Dezie
dị na ngalaba nhazi mpagharaBadagry Dezie
usoro ederedeLatin script Dezie
Ọkwa asụsụ Ethnologue5 Na-etolite Dezie
Koodu asụsụ Wikimediaguw Dezie

Asụsụ Gun bụ asụsụ nke abụọ a na-asụkarị na Benin. A na-asụkarị ya na ndịda mba ahụ, na Porto-Novo, Sèmè-Kpodji, Bonou, Adjarra, Avrankou, Dangbo, Akpro-Missérété, Cotonou, na obodo ndị ọzọ ebe ndị Ogu bi. Ndị Ogu ole na ole nọ na ndịda ọdịda anyanwụ Naijiria na-asụkwa ya n'akụkụ ókèala Benin, ọkachasị Badagry, Maun, Tube.

Akwụkwọ edemede dezie

E dere asụsụ ahụ na akwụkwọ edemede atọ, ha niile dabere na mkpụrụ akwụkwọ Latin. N'ala Naijiria, edere ya na akwụkwọ edemede yiri nke Yoruba na ụfọdụ asụsụ ndị ọzọ nke Naijiria. Na Benin, e mepụtara akwụkwọ edemede zọ maka ibipụta nsụgharị Bible na 1923, e mezigharịrị ya na 1975, a na-ejikwa ya ugbu a maka ịkụzi ịgụ na ide n'ụlọ akwụkwọ ụfọdụ na Benin; ọ yiri orthograph nke Fon, na-eji mkpụrụedemede ndị dị ka Ōáááá na Ōá.[3] E nwere aro iji jikọta orthographies, dịka ọmụmaatụ nke Hounkpati Capo mere na 1990.[4]

Edensibia dezie

  1. Gun (en). Ethnologue. Retrieved on 2021-01-10.
  2. Kluge (2007). "The Gbe Language Continuum of West Africa: A Synchronic Typological Approach to Prioritizing In-depth Sociolinguistic Research on Literature Extensibility". Language Documentation & Conservation: 182–215. 
  3. Iyetunde Ofulue (2015). in Orie: Bilingualism and Language Maintenance in Small Language Communities: The Case of Gungbe, Ilọri, Johnson F., Yuka, Lendzemo Constantine., Newcastle-upon-Tyne: Cambridge Scholars Publishing, 54. ISBN 978-1-4438-8142-5. OCLC 954254260. 
  4. Capo (1990). "Towards a Viable Orthography for Egungbe". African Languages and Cultures 3 (2): 109–125. DOI:10.1080/09544169008717715. ISSN 0954-416X. 

Akwụkwọ ọgụgụ dezie