Ahmed Gomaa Ahmed Radwan
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Egypt |
aha enyere | Ahmed |
Asụsụ obodo | Arabic |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Arabic |
ọrụ ọ na-arụ | ọkà mmụta sayensị, injinia, professor |
onye were ọrụ | Cairo University |
Onye òtù nke | Institute of Electrical and Electronics Engineers |
Ihe nrite | Fellow of the African Academy of Sciences |
Ahmed Gomaa Ahmed Radwan bụ ọkammụta si mba Ijipt na ngalaba Engineering Technology & Applied Sciences na isi ọmụmụ injinia na Mahadum Cairo, Ijipt. Ọ bụ onye òtù a họpụtara na African Academy of Sciences, onye isi n'òtù Institute of Electrical and Electronics Engineers. Ọ bụbu onye ntụzi aka na ụlọ ọrụ Nanoelectronics Integrated Systems Center nke Mahadum Nile, na onye isi ụlọ ọrụ nka maka mmepe ọrụ (TCCD), Mahadum Cairo. [1][2] Ọ bụ ugbu a onye isi oche nwa oge nke nnyocha na ọrụ nkwado, Mahadum Nile, Ijipt.[3]
Agụmakwụkwọ Ya
dezieAhmed Gomaa Ahmed Radwan gara Mahadum Cairo site na nzere B.Sc ruo ọkwa PhD ya. Ọ nwetara nzere B.Sc na Electronics Communications n'afọ 1997. Ka afọ abụọ gasịrị, ọ gbakwunyere diploma na Engineering Mathematics (1999) wee gụchaa ma nweta nzere M.Sc na Engineering Mathematics n'afọ 2002. Ọ nwetara akara mmụta doctorate na Engineering Mathematics n'afọ 2006. [3]
Ihe nrite na òtù Ndị O sogasị na ha
dezieN'afọ 2003, ọ ritere ihe nrite ederede ndị na-eme Master kacha mma (2001-2004) na ngalaba Engineering na Mahadum Cairo, Ijipt.[3] Na 2011, o ritere ihe nrite akwụkwọ nke abụọ kacha mma na ọgbakọ mba ụwa nke microelectronics (ICM) na Tunis.[3] N'afọ 2012, e nyere ya onye òtù gbagotere na IEEE.[3] N'otu afọ ahụ, e nyere ya ihe nrite onye mere ihe ahụrụ anya nke steeti.[1] N'afọ 2013, o ritere nturu ugo Physical Science Award na asọmpi afọ 2013 bụ International Publishing Competition nke Misr El-Khair Institution [3] N'otu afọ ahụ, ọ ritere ihe nrite mmezu nke Mahadum Cairo,[1] N'afọ 2014, ahọpụtara ya dị ka onye so na kansụl sayensị mbụ nke Egypt Center for the Advancement of Science, Technology and Innovation (ECASTI). N'afọ 2016, o ritere nturu ugo Prof. Mohamed Amin Lotfy.[1] N'afọ 2018, o nwetara akara ugo ógó mbụ na mmụta sayensị na nka nke steeti, abịa n'afọ 2019, ọ nata akara ugo mmụta steeti kacha mma ma nwetakwa Scopus Award na ngalaba Injinia na na Teknụzụ.Templeeti:Cn
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 Ahmed Gomaa Ahmed Radwan | The AAS. Archived from the original on 2021-02-19. Retrieved on 2023-12-04.
- ↑ Institute of Electrical and Electronics Engineers.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 3.5 Ahmed Gomaa Ahmed Radwan.