Adeola Ariyo
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
aha ezinụlọ ya | Ariyo |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1980s |
Ebe ọmụmụ | Lagos |
Asụsụ obodo | Asụsụ Yoruba |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Asụsụ Yoruba, pidgin Naịjirịa |
ọrụ ọ na-arụ | model |
onye were ọrụ | Elizabeth Arden, Inc. |
nnọchiaha nkeonwe | L484 |
Adeola Ariyo bụ onye Naijiria bụ onye nlereanya na eze nwanyị mara mma nke ghọrọ onye mbụ nnọchi anya mba Afrịka nke Elizabeth Arden n'afọ 2014.[1] Ọ malitere ọrụ ime ihe ngosi ya mgbe ọ dị afọ iri na atọ mgbe a chọpụtasịrị ya ma nsonye ya na London Fashion Week.[2] A na-akpọ Adeola mgbe ụfọdụ dị ka onye Naijiria-Ghanaian maka ihe nketa ya.[2] A mụrụ ya n'aka nne Ghana na nna Naijiria.
Oge ọ malitere
dezieA mụrụ Adeola na Lagos n'aka nne Ghana na nna Naijiria. Ọ tolitere na Naịjirịa mana mgbe ụfọdụ ya na nna ya na-aga London. Nsonye ya na London Fashion Week mgbe ọ dị afọ iri na atọ mezuru mgbe ya na nna ya gara ịzụ ahịa na London.[3] Ọ bụ ezie na ọ na-anọkarị na Cape Town, South Africa, mànà Adeola na-agakwa Lagos na London.[4]
Mmepụta ọlụ ihe Nlereanya ya
dezieỌlụ ihe nlereanya Adeola malitere mgbe ọ dị afọ iri na atọ mgbe ọ zutere Alek Wek na Kate Moss ozugbo ụlọ ọrụ London Fashion Week bịanyere aka na ya.[5] N'afọ 2005, o sonyere na asọmpi Nokia Face of Africa ma kemgbe ahụ, ọ na-arụsi ọrụ ike na ihe ngosi mba ụwa.[4] Ewezuga igosi na London Fashion Week, Adeola egosila na izu ejiji ndị ọzọ. Ndị a ma ama n'etiti ha bụ Johannesburg Fashion Week, Mozambique Fashion Week, Cape Town Fashion Week, Arise Fashion Week Lagos na London Fashion Week.[5] Ọ nọrọ ọtụtụ afọ na-eme ihe nlereanya na South Africa tupu ọ nweta nhọpụta Elizabeth Arden na Febụwarị 2014.[6] Ewezuga igosi na izu ejiji dị iche iche, Adeola gosipụtakwara maka ọtụtụ akwụkwọ ejiji dịka Marie Claire, True Love na Fair Lady, Cosmopolitan na Glamour.[7]
Ọrụ ndị ọzọ
dezieN'ịbụ onye Afrịka, Adeola etinyewokwa aka n'ọtụtụ ọrụ ebere na ọrụ mmata. Ihe a ma ama n'etiti ọrụ ebere ya bụ itinye aka ya na "The Lunchbox Fund", ọrụ e mere iji nye nri kwa ụbọchị maka ụmụaka ụlọ akwụkwọ na-adịghi ike, na ụmụ mgbei na South Africa. Adeola tinyekwara aka na ọrụ Elizabeth Arden ndị ọzọ dị ka "Make a Visible Difference" Campaign.[8]
Edensibịa
dezie- ↑ Zoe Efstathiou (2015-03-27). Elizabeth Arden appoints Adeola Ariyo as African Ambassador (en-GB). Global Cosmetics News. Retrieved on 2020-11-12.
- ↑ 2.0 2.1 Rey (2016-08-20). Model: Adeola Ariyo (en-US). Sola Rey. Archived from the original on 2020-11-17. Retrieved on 2020-11-12.
- ↑ Adeola Ariyo becomes first African brand ambassador for Elizabeth Arden. cosmeticsbusiness.com. Retrieved on 2020-11-12.
- ↑ 4.0 4.1 Boss Models Cape Town. Adeola Ariyo | Women | Mainboard Mgmt | Boss Models Cape Town - Women and Men for South African and International Bookings (en). Boss Models Cape Town. Retrieved on 2020-11-12.
- ↑ 5.0 5.1 BLANCK (2019-07-22). THE INTERVIEW: ADEOLA ARIYO ON THE AFRICAN MODELLING INDUSTRY (en). Blanck Digital. Archived from the original on 2020-11-12. Retrieved on 2020-11-12.
- ↑ The Cut off. Adeola Ariyo for Elizabeth Arden (en). Retrieved on 2020-11-12.
- ↑ Odusola (2019-07-22). THE INTERVIEW: ADEOLA ARIYO ON THE AFRICAN MODELLING INDUSTRY (en). Blanck Digital. Archived from the original on 2020-11-12. Retrieved on 2020-11-12.
- ↑ Adeola Ariyo | Women | Mainboard Mgmt | Boss Models Cape Town - Women and Men for South African and International Bookings (en). Boss Models Cape Town. Retrieved on 2020-11-12.