Aïssata Tall Sall
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Senegal |
aha enyere | Aïssata |
ụbọchị ọmụmụ ya | 12 Disemba 1957 |
Ebe ọmụmụ | Podor |
Ikwu | Birane Hane, Elimane Samba Hane |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | French language |
ọrụ ọ na-arụ | onye ọka iwu, Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, omee ihe nkiri |
Ọkwá o ji | Member of the National Assembly of Senegal, Foreign Minister of Senegal |
ebe agụmakwụkwọ | Université Cheikh Anta Diop |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Socialist Party of Senegal |
Aïssata Tall Sall (Amụrụ na 12 Disemba 1957) bụ onye ọka iwu na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke Senegal bụ onye bụ Minista Na-ahụ Maka Mba Ọzọ kemgbe Nọvemba 2020.
A mụrụ Tall na 12 Disemba 1957 na Podor ma si n'ezinụlọ Marabout na-agbaso omenala.[1][2] Ọ bụ nwa mbụ n'ime ụmụ nwanyị itoolu na ụmụ nwoke abụọ ma kwaga Dakar maka agụmakwụkwọ ya mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ praịmarị.[2] Ọ gụrụ akwụkwọ iwu na Mahadum nke Dakar ma mgbe ndị Bar Council agaghị etinye ha, ya na ndị ọka iwu iri atọ ndị ọzọ na-eto eto kpọgara ha n'ụlọ ikpe mkpegharị ma merie.[2] E debara aha ya na Senegal Bar n'afọ 1982.[3]
Tall bụ ọkachamara na iwu azụmaahịa tupu ọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ọ bụ onye nkwado n'ọtụtụ ikpe ndọrọ ndọrọ ọchịchị megide ọchịchị Wade site n'afọ 2000 ruo afọ 2012.[2] Ọ nọchitekwara anya ndị ọchịagha Ivorian Lassana Palenfo na Ibrahim Coulibaly, onye bụbu onye isi ala Mauritania Mohamed Ould Haidalla, onye bụzi praịm minista Togo Agbéyomé Kodjo na onye isi ala Mali Dioncounda Traoré.[2] N'oge ikpe nke Palenfo na Coulibaly, onye na-eme ihe nkiri Abderrahmane Sissako bịakwutere ya ma gosipụta onwe ya na ihe nkiri 2006 Bamako, banyere ikpe megide IMF na World Bank.[2]
Ebenside
dezie- ↑ Aissata Tall Sall. Senegel - Senegalese Next Generation of Leaders.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 2.4 2.5 Ba (15 June 2015). Sénégal : Aïssata Tall Sall, objectif présidentielle (French). Jeune Afrique. Retrieved on 16 November 2020.
- ↑ Sall Aissata Tall (French). Ordre Des Avocats u Senegal.