Ịlọ ụwa
religious concept, superpower
obere ụdị nkehypothetical event Dezie
Akụkụ nkeÁkọ na Uche, religion Dezie
ihu nkeBuddhism, Okpukpe Hindu Dezie
ihe kpatara yaprevious life Dezie
nwere mmetụtaafterlife Dezie

Ịlọ ụwa

Ndị Igbo kwenyesiri ike n'ịlọ ụwa bụ mmadụ ịlọghachi ụwa ọzọ mgbe ọ nwụchara anwụ. ọ bụ onye mmadụ hụrụ n'anya ka ọ na-alọrọ ụwa. ndị Igbo kwenyere na ọ bụ onye a kwara nke ọma na kwa onye biri ndụ nke ọma na-alọ ụwa. Mmadụ ọjọọ anaghị alọ ụwa.


Etu esi amata onye lọrọ ụwa

Ọ bụ dibịa afa na-agba afa nwata a mụrụ ọhụrụ iji mata onye ọ lọrọ ụwa ya. Ọzọkwa, ndị nne na nna tinyere agbataobi na-esite n'akparaagwa nwata mata onye ọ lọrọ ụwa ya. Mgbe ụfọdụ, okenye na-ekwu onye ọ ga-alọrọ ụwa mgbe ọ ka dị ndụ.


Uru Ịlọ Ụwa bara

Ọ na-eme ka mmadụ na-echeta onye nke ya nwụrụ anwụ.

Ọ na-emekwa ka nweta ihe ọma dị iche iche n'ihi na ọ lọrọ ụwa mmadụ.

Ọ na-emekwa ka mmadụ bie ndụ dị mma n'ihi na onye agwa ọjọọ anaghị alọ ụwa.


Edemsibịa

Chinwe, U. O na Udoka, E. (2011), Nhazi Asụsụ Igbo. A.C. Global Publishing Co. Onitsha