Yaya Coulibaly

Onye mmebe nwa bebi nke Mali, onye na-agụ akwụkwọ na onye na-akọ akụkọ sitere na Mali.
Yaya Coulibaly
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịMali Dezie
Aha enyereYaya Dezie
aha ezinụlọ yaKulibali Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Eprel 1959 Dezie
Ebe ọmụmụKoulikoro Region Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaFrench language Dezie
Ọrụ ọ na-arụpuppeteer Dezie
ebe agụmakwụkwọInstitut National des Arts, Bamako, National School for Higher Education in Puppetry Arts Dezie

Youssouf Coulibaly (amụrụ na Jenụwarị 2, 1993) bụ onye Mali na-emepụta nwa bebi, na onye na-akọ akụkọ si Mali.

Oge ọ malitere dezie

A mụrụ ya n'ezinụlọ ndị na-eme ihe nkiri, nke nwere mgbọrọgwụ Bamana, ọ malitere mmalite ya na ihe nkiri na ihe oyiyi mgbe ọ dị afọ iri dị ka onye na-amụ ọrụ n'aka nna ya. O mechara mụọ nka na Institut National des Arts de Bamako, na ihe nkiri nwa bebi na Ecole Nationale Supérieure des Arts de la Marionnette na Charleville-Mézières, France.

Ọrụ dezie

N'afọ 1980, o guzobere ụlọ ọrụ nwa bebi nke ya, Sogolon Puppet Troupe, ma kemgbe ahụ ọ ghọrọ onye isi na-elekọta ọdịnala nwa bebi Bambara, nke kacha ochie na nke kacha baa ọgaranya n'omenala nwa bebi Africa.[1] Coulibaly bụ onye na-elekọta nnukwu nchịkọta ụmụ bebi, ọtụtụ n'ime ha abịala ya site n'ezinụlọ ya. N'ikwu okwu banyere mmasị ya, Coulibaly kwuru, sị:[1]

Ana m adabere na ụmụ bebi, ezinụlọ m na-ebi naanị maka nke a. Nke a bụ ụlọ akụ m, nke a bụ ókèala m, nke ahụ bụ akwụkwọ m, nke ọ bụ ókèala mụ niile na kwa ụbọchị Chineke na-enye anyị.

Coulibaly emeela ihe nkiri ọhụrụ na nke dị ike nke sitere na ọdịnala oge ochie nke ime ihe nkiri na West Africa. Ihe ngosi ya na-agụnye akụkọ ọdịnala na akụkọ mgbe ochie na ihe omume sitere na nnukwu akụkọ ihe mere eme nke Mali, yana akụkọ ihe mere na nkọwa banyere ndụ nke oge a na Mali. Usoro ndị ọ na-eme n'egwuregwu ya gụnyere ụmụ bebi aka, ụmụ bebi osisi, ụmụ beji, ihe nkpuchi na egwu dị ndụ. Sogolon emeela ihe ngosi na Europe na USA.[2][3][4] E gosipụtara nhọrọ nke nchịkọta ụmụ bebi a na Germany, South Africa na USA.[5]

Ebensidee dezie

  1. 1.0 1.1 Xue, Qin (19 October 2012). Mali puppet theater stuns audiences. China Central Television. Archived from the original on 12 May 2016. Retrieved on 26 April 2016.
  2. Le Figaro - Actualité en direct et informations en continu. Retrieved on 18 September 2018.
  3. Greskovic (13 October 2005). Puppets and Polemics. Retrieved on 18 September 2018.
  4. Isherwood. Long-Necked, but All the Rage in Paris. Retrieved on 18 September 2018.
  5. Tall Horse. Handspring Puppet Company (2012). Retrieved on 26 April 2016.

Njikọ mpụga dezie