Xi Shi
Mmádu
Akụkụ nkeFour Beauties Dezie
ụdịekerenwanyị Dezie
aha ezinụlọ yaShi Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya506 BCE Dezie
Ebe ọmụmụZhuji Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya5. century BCE Dezie
Dị/nwunyeFuchai Dezie
intangible cultural heritage statusList of Representative Items of National Intangible Cultural Heritage Dezie
WikiProject na-elekọta yaWikiProject Intangible Cultural Heritage Dezie

Xi Shi ( Hsi Shih nke pụtara (Nwanyị) Shi onye nke Ọdịda Anyanwụ") bụ, dị ka akụkọ mgbe ochie si kwuo, otu n'ime ụmụ nwanyị ama ama dị anọ mara mma nke China oge mgbeochie. Ekwuru na Xi Shi biri n'oge ngwụcha oge opupu ihe ubi na mgbụsị akwụkwọ na obodo Zhuji, isi obodo steeti Yue n'oge ochie.

N'akụkọ ọdịnala, akpọrọ Xi Shi Shi Shiigu (施 夷 光). [1] Onye minista Yue Fan Li chọtara n'ihi oke mma ya ya wee nye ya Eze Fuchai nke Wu site n'aka eze Goujian nke Yue n'ịrụ ọrụ mmekọ nwoke na nwanyị. Ihe nke a mebiri steeti Wu na afọ 473 BC. Akụkọ kọrọ n'ihi oke mma Xi Shi, Eze Fuchai nke Wu ozugbo enyere ya nwanyị ama ha chefuru na ọ nọ n'agha. Ọwere oge ya niile na elele Xi Shi ma na achọ ụzọ ime ya obi ụtọ. Akụkọ nke a pụtara na mbụ n'akwụkwọ opupu ihe ubi na mgbụsị akwụkwọ nke Wu na Yue (nke akpọrọ Spring and Autumn Annals of Wu and Yue n'asụsụ Bekee) nke ebipụtara n'narị afọ ise mgbe mmeri ahụ enwechara gachara, ma na ọ nọghị na ọrụ ndị mbụ dịka Guoyu, Zuo zhuan, na Records of the Grand Historian . [2]

A maara Xi Shi, Wang Zhaojun, Diao Chan na Yang Guifei dị ka "ụmụ mma anọ na China oge ochie", nke Xi Shi bụ onye mbụ. Akụkọ kwuru na ụmụ nwanyị ndị biri ndu n'oge dị iche iche mana oke mma ha mere ka a na akokọta akụkọ ha ọnụ. [3]

Ọdịdị dezie

Ekwuru na ịma mma Xi Shi dị oke egwu nke na ọ n'ehulata ala na mbara ihu ka ọ n'ele azụ dị n'ime ọdọ mmiri ahụ, ọ na eme azụ nke na ha ichefu igwu mmiri ma mikpuo n'okpuru ala.

Akụkọ Xi Shi dezie

Eze Fuchai nke Wu tụrụ Eze Goujian nke Yue mkpọrọ mgbe e meriri ya n'agha, ma Yue mechara bụrụ steeti ụtụ nke nọ na okpuru Wu . Na nzuzo, ka a n'eme atụmatụ ịbọ ọbọ, onye ozi Goujian Wen Zhong tụrụ aro ịzụ ụmụ nwanyị mara oke mma ma nye ha Fuchai dị ka ụtụ (n'ihi na ha mara na Fuchai enweghị ike iguzogide ụmụ nwanyị mara mma). Onye ozi ya ọzọ, Fan Li, chọtara Xi Shi na Zheng Dan, wee nye ha Fuchai na afọ 490 BC.

Mma ọ mara na obiọma Xi Shi na Zheng Dan mere ka Eze Fuchai chefuo ihe niile gbasara ọnọdụ steeti ya. Na mkpali ha ọ wee gbuo onye ndụmọdụ ya kacha mma, onye ukwu nke bụ Wu Zixu . Fuchai wuru ọbụ na Obí Guanwa (Obí Ndị Nwanyị Mara Mma) n'ogige ntụrụndụ eze na mkpọda ugwu Lingyan, ihe dị ka kilomita iri na ise (9.3 mi) n'ọdịda anyanwụ nke obodo Suzhou . Ike Wu belatara, na afọ 473 BC .Goujian bidoro iku ya agha wee merie ndị agha Wu kpamkpam. Eze Fuchai kwara akwa arịrị na ọ kwesịrị ige Wu Zixu ntị karịa igbu ya. Nke a mere Eze Fuchai wee gbuo onwe ya .

N'akụkọ ifo nke a, mgbe ọdịda Wu gasịrị, Fan Li (范蠡) lara ezumike nka n'ọkwa ozi ya wee soro Xi Shi nọrọ n'ụgbọ mmiri ịkụ azụ, na -agagharị dị ka akụkọ ifo n'ọzara nke ọdọ mmiri Taihu, nke enweghị onye hụrụ ha ọzọ. Nke a dị ka Yuan Kang's Yue Jueshu (越 绝 书) si were kọ akụkọ. N'Ụdị ọzọ, dị ka Mozi si kwuo, bụ Xi Shi mechara nwụọ site na rikpuru n'ime osimiri.

Mmetụta dezie

Ụlọ nsọ Xi Shi, nke dị n'okpuru ụkwụ Zhu Luo Hill (苎 萝) na ndịda Xiaoshan, n'akụkụ Osimiri Huansha .

Ekwuru na West Lake dị na Hangzhou bụ nnabata Xi Shi, ya mere a na -akpọkwa ya ọdọ mmiri Xizi. Xizi bụ aha ọzọ maka Xi Shi, nke pụtara Nwanyị Xi. N'ime ọrụ a ma ama nke abụ, , onye ọkà mmụta ama ama Su Shi ji mma Xi Shi tụnyere mma ọdọ mmiri .

Li Bai nke ndị eze Tang dere abụ gbasara Xi Shi.

A kpọtụrụ Xi Shi aha n'akwụkwọ akụkọ Njem gaa Ọdịda Anyanwụ, dị ka akara nke amara na ịma mma.

A kpọtụrụ Xi Shi aha n'akwụkwọ akụkọ Dream of the Red Chamber, a kọwara onye ejije Lin Daiyu dị ka onye na -arịa ọrịa dịka Xi Shi, ma nwee mma karịa ya. Ma Lin na Xi Shi kọwara ya dị ka oyiyi nke ọmarịcha nwanyị na-arịa ọrịa.

Xi Shi pụtara na mkpirikpi akụkọ nke Jin Yong (Louis Cha), " Mma agha nke nwa agbọghọ Yue ".

Aha ya kpalitekwara aha Shih Tzu nke oge a, onye aha ya na China ma asụgharịa ya bụ "nkịta Shi Shi", mana akpọrọ ya aha bekee nke sitere n'okwu "ọdụm". Edebere "nkịta ọdụm" n'asụsụ Chinese dị ka Pekingese .

Ntụrụaka dezie

 

  1. 古代笔记中的西施归宿之争. Archived from the original on 2017-08-11. Retrieved on 2021-08-31.
  2. 渔歌唱晚话西施 (in zh). Retrieved on 16 May 2020. 
  3. "Before dragons coiled and tigers crouched: Early Nanjing in history and poetry". Journal of the American Oriental Society; Ann Arbor 115.