Visst katten har djuren sjál!

Visst katten har djuren sjál!
ọrụ edemede
Isiokwu nlebanyaanụmanụ Dezie
Odee akwụkwọMargit Sandemo Dezie
asụsụ eji dee ọrụSwedish, Norwegian Dezie
afọ/ụbọchị mbipụta1994 Dezie

Visst Katten har djüren Sjál - En samling historier av och for djurvanner na Swedish na Jovisst har dyrene sjel na Norwegian (na English Sure an Animal Has a Soul - An Anthology of Tales about and for our Animal Friends; a sụgharịbe akwụkwọ a nʼasụsụ na bekee) ọ bụ akwụkwọ na-abụghị akụkọ ifo banyere ụmụ anụmanụ nke onye dere ya bu onye Norwegi-Swedish aha ya bu Margit Sandemo. E nwere egwuregwu okwu na aha mbụ nke akwụkwọ ahụ na Swedish, n'ihi na a na-ejikwa okwu ahụ bụ "katten," na mgbakwunye na ihe ọ pụtara "kịta, " mee ihe na ahịrịokwu Swedis nke pụtara 'ata ya ahụhụ!" atụgharịrị n'ụzọ, aha akwụkwọ ahụ bụ An Animal Has a Soul, (a Cat) Damn It!

E dere akwụkwọ a dị ka esi dee Vi är inte ensamma, akwụkwọ banyere ndị mmụọ ozi na-eche nche. Sandemo jụrụ ndị na-agụ akwụkwọ akụkọ Norwegian kwa izu Hjemmet na Swedish Hemmets Journal ma ha kwenyere na ụmụ anụmanụ nwere mkpụrụ obi. Ọ natara ihe karịrị akwụkwọ ozi 1500 site n'aka ndị na-agụ magazin, na enweghị otu azịza na'etiti ha. E ji azịza ndị a mee ihe dị ka ihe bụ isi nke akwụkwọ ahụ. Visst katten har Jüren Sjál onwe ya nwere ọtụtụ akụkọ mkpirikpi na foto ndị na-atọ ọchị karịsịa banyere anụ ụlọ, yana anụ ọhịa. Akụkọ ahụ sere okwu site na nzaghachi ndị na'agụ akwụkwọ, o nwekwara obere ederede nke onye edemede ahụ n'onwe ya, ọkachasị okwu mbido, okwu mmechi na nkọwa ole na ole.

Margit Sandemo hụrụ ụmụ anụmanụ n'anya mgbe ọ bụla, ọ gosikwara na akwụkwọ akụkọ ya. Ọ bụ onye nsọpụrụ nke otu Kjemp för Dyrene, nzukọ na-ahụ maka ikike ụmụ anụmanụ na Norway.

Ọdịnaya dezie