Vincent Kofi
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Ghana |
aha enyere | Vincent |
aha ezinụlọ ya | Kofi |
ụbọchị ọmụmụ ya | 16 Jenụwarị 1923 |
Ụbọchị ọnwụ ya | 31 Julaị 1974 |
ọrụ ọ na-arụ | onye ese, onye nkuzi |
ebe agụmakwụkwọ | Achimota School, Royal College of Art, Columbia University |
agbụrụ | Ndi Afrika nke Amerika |
ikike nwebiisinka dị ka onye okike | Ọrụ nwebiisinka chekwara |
Vincent Akwete Kofi (1923-1974) bụ onye Ghana na-ese ihe, ma burukwa onye agụmakwụkwọ.
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Vincent Akwete Kofi na Odumasi-Krobo, Ghana na 16 Jenụwarị,1923. Ọ nwụrụ na 31 Julai, 1974.[1][2] Ọ gụrụ akwukwo na Achimota College, nke nwere ngalaba nke mbụ na nke kachasị na West Africa, ọ gụkwara akwụkwọ na Royal College of Art, London (1952-1955), wee gaa Columbia University, New York (1959). Mgbe ọ nọ na New York, ọ mụtara ịkpụ ígwè ma, site n'enyemaka nke Harmon Foundation, o mepụtara ihe nkiri na ịkpụ ọla nchara.[1]
Ọ lụrụ Felicia Korkor Djabatey tupu afo 1946, na Krobo, Kwaebibirem, Eastern, Ghana. Ha mụrụ nwa nwanyị Janet ayerko Kofi.[2][3]
Ọrụ na ahụmahu
dezieMgbe ọ laghachiri Ghana, ọ kụziri na Winneba Teacher Training College (1961-1969) ma bụrụkwa Onye isi nke Fine Art, College of Art, na Kwame Nkrumah University of Science and Technology (KNUST) Kumasi (1969-1974). Ọ bụ onye otu ndị nnọchi anya Ghana na First World Festival of Negro Arts, Dakar, 1966. Na afo 1971 ọ gara India na oku nke Gọọmentị.[1]
Ebensidee
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 Kofi, Vincent Akwete (1923–1974) - Routledge Encyclopedia of Modernism (en). www.rem.routledge.com. Retrieved on 2022-02-26.
- ↑ 2.0 2.1 FamilySearch.org. ancestors.familysearch.org. Retrieved on 2022-04-02.
- ↑ FamilySearch.org. ancestors.familysearch.org. Retrieved on 2022-04-02.