Velile
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | South Africa |
aha ezinụlọ ya | Mchunu |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1973 |
Ebe ọmụmụ | KwaMashu |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | stage actor, onye na-abụ abụ |
Ebe ọrụ | Johannesburg |
Velile (amụrụ Velile Mchunu n'afọ 1973 na KwaMashu, Natal, South Africa ) bụ onye South Africa na-agụ egwu pop na onye na-eme ihe nkiri. A maara ya karịchaa site na egwu "Helele", nke RTL (redio French) na telivishọn Switzerland jiri ruọ ọru na ngosi nke Football World Cup n'afọ 2010 na South Africa, ma na Germany dị ka onye na-eme ihe nkiri na mmepụta Hamburg nke egwu The Lion King .[1][2]
Akụkọ ndụ
dezieMchunu tolitere n'obodo dị nso n'obodo Durban nke South Africa ma gaa ụlọ akwụkwọ ihe nkiri na "Committed Artist Academy" na Johannesburg. N'afọ 1999, ya na Stevie Wonder na Michael Jackson gosiputara n'oge ụbọchị ọmụmụ Nelson Mandela. Na Hamburg, ọ rụrụ ọrụ dị mkpa nke shaman Rafiki na egwu "The Lion King" ruo ọtụtụ afọ. Na-nsote, ọ pụtara na egwu Sarafina yana ihe nkiri South Africa nke afọ 1992 nke otu aha ahụ, banyere nwa okorobịa isi ojii South Africa na-anwa ike ya maka nnwere onwe n'oge ịkpa ókè agbụrụ. Ọ gara njem iji mee ihe ngosi nke egwu Izidumo na Ipi Ntombi. Ọ pụtakwara na njem 2006 dị ka onye soloist nye n'egwú dị iche iche.[1][2][3]
Discografị
dezieAlbọm
dezie- Tales from Africa (2010)
- Lion Queen (2011)
Ndi dị otu
dezie- Helele (Velile & Safri Duo) (2010)
- Kuyabanda (2010)
- Injabulo (2011)
Edensibia
dezie- ↑ 1.0 1.1 Germany. Unser Veranstaltungstipp – Soko und Velile spielen afrikanischen Jazz (de-DE). Hannoversche Allgemeine Zeitung. Archived from the original on 2017-12-01. Retrieved on 2017-11-18.
- ↑ 2.0 2.1 Ein Song und seine Geschichte: Velile Mchunu & Safri Duo: "Helele" | Musik-Center | BAYERN 3 | BR. Br-online (2010-07-07). Archived from the original on 2010-07-07. Retrieved on 2017-11-18.
- ↑ Universal Music Deutschland: Deine Stars, deine Musik, alle Genres (de-DE). www.universal-music.de. Retrieved on 2017-11-18.