Ugba

Ugba dezie

 
Ugba na Abacha

Ugba, bu nri ndị igbo nke ana-akpokwa Ukpaka. ọ bụ nri ama n'etiti ndị Igbo na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Naijiria. Ugba bụ mgwa ihe a na-eji esi nri na ịkwadebe ụfọdụ nri ọdịnala. N'ala Igbo, a na-eji ugba eme Abacha (nke a na-akpọ African salad), gwakọta ya na azụ̀ esiri esi, ka e kwuo ole na ole.[1]

Uru Ahụike dezie

 
Ugba

Ugba bara ezigbo uru na-edozi ndị na-eri ya ahụ.Ugba bụ ezigbo isi iyi nke protein, ọ bụkwa ezigbo isi iyi ike, amino acid, phosphorus, magnesium, iron, vitamin, calcium, manganese na ọla kọpa. Ọ bara ụba na phytochemical dị ka; Tannins, alkaloids, flavonoids, sterols, glycosidase na saponins.[2]

  1. How It Is Made Ugba:The Heart Of Traditional Igbo Meals and other ethnic (en-US). The Guardian Nigeria News - Nigeria and World News (2022-02-16). Archived from the original on 2022-09-24. Retrieved on 2022-09-24.
  2. Ed Brown (2020-04-09). How to Make Boiled Yam & Ugba Sauce (African Oil-Bean Seed) (en-US). Royac Shop. Retrieved on 2022-09-24.