Turai Yar'Adua

Nwanyị mbụ nke Nigeria
Turai Yar'Adua
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịNaijiria Dezie
Ụbọchị ọmụmụ yaJulaị 1957 Dezie
Ebe ọmụmụKatsina Dezie
Dị/nwunyeUmaru Yar'Adua Dezie
Asụsụ obodoAsụsụ Hausa Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee, Asụsụ Hausa, pidgin Naịjirịa Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, educator Dezie
Ọkwá o jiFirst Lady of Nigeria Dezie
ebe agụmakwụkwọMahadum Ahmadu Bello Dezie
okpukpere chi/echiche ụwaOkpukpere Alakụba Dezie

Hajiya Turai Umar Musa Yar'Adua (amụrụ ya na 26 Jụlai afọ 1957) [1] bụ nwaanyị di ya nwụrụ nke bubu onye isiala nke Naijiria bubu Katsina Steeti gọvanọ Umaru Musa Yar'Adua . Ọ bụ Nwanyị mbụ nke Naijiria site na 2007 ruo ọnwụ nke di ya, onye isiala Yar'Adua, na Mee 5, 2010.

Mmụta dezie

A mụrụ Turai Yar'Adua na mpaghara obodo ukwu nke Katsina nke dị na mgbago ugwu Naịjirịa na Julaị 1957. [1] Ọ gara ụlọ akwụkwọ gọvụmentị ụmụ nwanyị na Kankiya dịka nwatakịrị.

Turai Yar'Adua gara ụlọ akwụkwọ praịmarị Garama na Katsina na gọvụmentị Secondary School dị na Kankia, ha abụọ dị na steeti Katsina. O mechara debanye aha na Katsina College of Arts, Science and Technology na Zaria, Kaduna steeti, ebe a na-akọ na a kpọrọ ya "nwa akwụkwọ kachasị mma" n'afọ 1980. [1] N’afọ 1983, Yar’adua nwetara akara ugo mmụta okokporo na asụsụ ya na Mahadum Ahmadu Bello . [2]

Ndụ onwe dezie

Turai lụrụ Umaru Yar'Adua n'afọ 1975, ma ha nwere ụmụ nwanyị ise na ụmụ nwoke abụọ. Ụmụ nwoke abụọ bụ Shehu Umaru Musa Yar'adua na Musa Umar Musa Yar'adua, Shehu bụ aha nwanne ya nwoke nke onye isiala Umaru Musa Yar '. adua nke nwuru anwu. Ma onye bụbu osote onyeisiala Naịjirịa. Otu n’ime ụmụ ha nwaanyị aha ya bụ Zainab lụrụ Usman Saidu Nasamu Dakingari, Gọvanọ nke Steeti Kebbi .

Na Septemba afọ 2007, Turai bụ ọbịa na inye ikike ịnwe ụlọ ọrụ Mobility Aid na Braille Center dị n’Akure, Ondo Steeti . Ọ bụ otu ụlọ ọrụ na-abụghị nke gọvụmentị ha were ụlọ ọrụ aka ọrụ bụ Handicapped Education Foundation (HANDEF) onye tọrọ ntọala bụ Olufunke Agagu, onye bụzị Nwanyị mbụ nke Ondo Steeti. Ndị ọzọ sonyere na mmemme ahụ bụ nwunye osote onye isi ala, Patience Jonathan, na ndị nwunye ọtụtụ ndị gọvanọ steeti ndị ọzọ. [3]

A nụrụ asịrị na Turai bụ otu n'ime ndị ndụmọdụ kacha di diya nso n'oge ọ bụ Onye isi ala nke Naijiria. [1] Ọmụmaatụ, Yar'Adua kwenyere na ọ metụtara nhọrọ Prọfesọ Babatunde Osotimehin, onye bụbu Director General nke National Action Committee on AIDS, dịka Minista Ahụike Naịjirịa n'oge ọchịchị di ya.

Ebe m si nwete dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 Gabriel, Chioma. "Turai Yar'Adua - a Silent But Influential First Lady", Vanguard Media, AllAfrica.com, 2010-01-15. Retrieved on 2010-05-05.
  2. Iliya, Christy. "Hajiya Turai: What Manner Of First Lady?", Leadership online, Leadership Newspapers Group. Retrieved on 2007-09-22.
  3. "First Lady rallies support for physically challenged persons".