Tina Drazu bụ Onye na-anya ụgbọelu na Uganda, onye na-eje ozi dị ka onye isi na Uganda National Airlines Company, Ụlọ Ọrụ Ụgbọelu Mba Uganda, na ngwá ọrụ A330-841, kemgbe Febụwarị 2021.[1] Tupu nke ahụ, kemgbe Eprel 2019, ọ bụ onye isi na ụgbọ elu CRJ 900, n'otu ụlọ ọrụ ụgbọ elu ahụ.[2] Ka ọ na-erule n'ọnwa Ọktoba afọ 2023, ọ bụ otu n'ime naanị ụmụ nwanyị abụọ na-arụ ọrụ na A330-841 na ụlọ ọrụ ụgbọelu ahụ.[3]

Tina Drazu
Born
NationalityUgandan
CitizenshipUgandan
OccupationProfessional Pilot
Years active2011 — present
Known forAviation
TitleCommercial Pilot at Uganda National Airlines Company

Mmalite na agụmakwụkwọ dezie

A mụrụ Drazu na Arua District, na mpaghara West Nile, na mpaghara Northern nke Uganda. O nwetara Ikike ụgbọelu azụmahịa ya na Cape Flying Services na South Africa n'afọ 2010.[2]

N'afọ 2020, ọ bụ otu n'ime ndị ọkwọ ụgbọelu ahọpụtara ka ha nweta ọzụzụ na ngwá ọrụ A330-800. Ọ gụsịrị ọzụzụ nke ụdị na Airbus Training Center na Miami, Florida, United States, na ngwụcha afọ 2020.[4]

Ọrụ dezie

Drazu nọrọ otu afọ na ọnwa atọ na-efe na Asante Airlines na South Sudan, site na Jenụwarị 2011 ruo Machị 2012. Ọ rụrụ ọrụ na Aerolink Uganda site na Julaị 2012 ruo Eprel 2019, dị ka onye na-anya ụgbọelu.[2] N'afọ 2013, mgbe ọ nọ na Aerolink, o mere Captain na Cessna 208 Caravan equipment.[5][6]

N'ọnwa Eprel 2019, ụlọ ọrụ ụgbọelu Uganda National Airlines were ya n'ọrụ, dịka otu n'ime ọnụ ọgụgụ dị nta nke ụmụ nwanyị na-anya ụgbọelu na ụlọ ọrụ ụgbọ elu ahụ.[7] Ka ọ na-erule n'ọnwa Febụwarị 2021, Drazu bụ otu n'ime ụmụ nwanyị ise na-efe Ụgbọelu Uganda Airlines, n'ime ndị ọkwọ ụgbọelu 50 na ụlọ ọrụ ụgbọelu ahụ. Ya na Vanita Kayiwa bụ naanị ụmụ nwanyị abụọ bụ ndị otu ndị na-arụ ọrụ n'ụgbọelu A330-841 na Uganda Airlines, n'oge ahụ. Tina Drazu na onye ọrụ ibe ya Vanita Kayiwa bụ ihe nlereanya maka ụmụ agbọghọ Ugandan chọrọ ịchụso ọrụ na ụgbọ elu. Ha abụọ agafeela karịa nwanyị ọ bụla bu ha ụzọ.[1]

Hụkwa dezie

  • Robert Wakhweya
  • Kokoro Janda
  • Rita Nasirumbi
  • Michael Etiang
  • Vanita Kayiwa

Edensibia dezie

  1. 1.0 1.1 Derek Nseko (10 February 2021). The new Uganda Airlines planes are here, what next?. Retrieved on 12 February 2021.
  2. 2.0 2.1 2.2 Agnes Tumuheire (29 April 2019). Meet The Uganda Airlines Pilots. New Vision. Retrieved on 15 September 2023.
  3. New Vision (23 October 2023). Pilot Drazu Shares Experience of Uganda Airlines Flight To Lagos (Video). New Vision. Retrieved on 26 October 2023.
  4. Spy Reports Uganda (21 October 2021). Tina Drazu: One Of The Pioneer Uganda Airlines Pilots Flying Country's Flag High. Spy Reports Uganda. Retrieved on 6 November 2021.
  5. TNU (21 October 2021). Tina Drazu, Uganda Airlines pilot Flying the Nation's flag High. Trumpet News Uganda (TNU). Retrieved on 15 September 2023.
  6. Rafiki Left A Leadership Vacuum. New Vision (16 June 2020). Retrieved on 15 September 2023.
  7. Edge Reporter (13 April 2019). Pictures: Uganda Airlines Unveils Pilots, Crew. The Edge Uganda. Archived from the original on 30 April 2019. Retrieved on 10 May 2019.


[1]

  1. Derek Nseko (10 February 2021). The new Uganda Airlines planes are here, what next?. Retrieved on 12 February 2021.