Studio One Eighty Nine
Studio One Eighty Nine bụ ụlọ ọrụ na-ahụ maka mmekọrịta ọha na eze nke dị na Ghana na United States. Ebumnuche ha bụ ịkwalite ejiji ndị Afrịka nakwa emume ejije ha na emepụta. Ọ nwere akara nke ya ma na-akwado ụdị ndị ọzọ. Ndị guzobere Studio One Eighty Nine, onye na-eme ihe nkiri bu Hollywood Rosario Dawson na onye bụbu onye isi nkwukọrịta Bottega Veneta Abrima Erwiah, mepụtara Fashion Rising na 2013 iji sọpụrụ V-Day Movement's One Billion Rising campaign.[1][2]
Mmalite na mmepe
dezieDawson na Erwiah malitere Studio 189 mgbe ha gachara ọtụtụ mba Afrịka na Febụwarị 2011, dịka akụkụ nke V-day.[3] Ha kwenyere na ịbawanye òkè ahịa nke ụlọ ọrụ ejiji na ịgba ume usoro ọdịnala ga-eduga na mgbanwe mmekọrịta mmadụ na ibe ya.[4]
Studio One Eighty Nine na-bu ndị na esonyere united nations international trade center na ethical fashion initiative..[5]
Nkesa
dezieStudio One Eighty Nine na-emepụta uwe ụmụ nwanyị, uwe ụmụ nwoke na ihe ụlọ. Site na uwe, akpụkpọ ụkwụ, ngwa, akpa na ohiri isi. A na-ere akara ahụ n'ịntanetị na saịtị ecommerce ha, na mgbakwunye na ebe ndị ọzọ a na-ere ahịa. Studio One Eighty Nine esorola Vogue Italia na YOOX[6] rụkọọ ọrụ ma wepụta nchịkọta pụrụ iche maka ikpo okwu a na ego na-abara ọrụ ebere Fashion 4 Development uru. A pụkwara ịchọta nchịkọta ahụ na Opening Ceremony, Smithsonian, Maison de Mode, Free People, Parisi, Surf Lodge, na Biffi Boutiques.[7]
Dawson na Erwiah natara Taormina Humanitarian Award na 61st Taormina Film Festival na June 2015. Na Jenụwarị 2015, e nyere Dawson na erwiah Martin Luther King Junior Award on Social Justice site na Mahadum Pennsylvania.[8]
ha anatalakwa ihe njurita ajuju site na magazin na ahu ma ka ejiji na nuuzpapars dika vogue Italia, wwD,grazia, vanity fair Italia e Pais the wall street journal bloom berg. Business ABC news and NY times.erwiah so na ọtụtụ n'ime Mmadu otu nari pụtara ìhè na true Africa maka onodu They're a na studio 189,[9][10],[11],[12].[13]
E gosipụtara nchịkọta oge opupu ihe ubi / oge okpomọkụ na Lower East Side Girls Club dị ka akụkụ nke New York Fashion Week.[14] N'afọ 2014 na 2015, a họọrọ Studio One Eighty Nine ka egosiputa ya dị ka akụkụ nke Design Indabaʹs 意Africa is Nowʹs na Cape Town na Durban, South Africa.[15]
- ↑ Abrima Erwiah. Archived from the original on 2016-03-04. Retrieved on 2022-06-26.
- ↑ Pang. Rosario Dawson's Adventures in Ghana, Celebrating Women and Her First Clothing Collection.
- ↑ Studio One Eighty Nine. Urban Bush Babes. Archived from the original on 2020-05-26. Retrieved on 2022-06-26.
- ↑ Ediciones El País (27 February 2015). Rosario Dawson: Musa de Quentin Tarantino y diseñadora sostenible - Estilo - EL PAÍS. EL PAÍS.
- ↑ Ethical Fashion Initiative - African Designer - Studio 189. ITC. Archived from the original on 2015-11-19. Retrieved on 2022-06-26.
- ↑ VOGUE BLACK.
- ↑ Studio One Eighty Nine Throws A Party For A Cause. Archived from the original on 2016-03-04. Retrieved on 2022-06-26.
- ↑ Penn News - Rosario Dawson Headlines MLK Lecture in Social Justice at Penn Jan. 20.
- ↑ Joelle Diderich. New Talents Get Spotlight in Milan. WWD.
- ↑ Rosario Dawson crea collezione in esclusiva per Yoox.com - VanityFair.it. vanityfair.it.
- ↑ Marshall Heyman (29 June 2015). Surfing, Shopping and Bundling Up in a Very Cool Montauk. WSJ.
- ↑ Retro Polo Shirts for Summer Fridays - Bloomberg Business. Bloomberg.com (27 July 2015).
- ↑ Team TRUE. Abrima Erwiah: the designer on fresh talent - TRUE Africa. True Africa.
- ↑ WhoSay - #CelebsUnfiltered, Social Celebrities, Entertainment News, Photos, Videos, and Exclusives. WhoSay.
- ↑ Fashion takes flight. Design Indaba.