Stella Martin Manyanya
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Tanzania |
aha enyere | Stella |
ụbọchị ọmụmụ ya | 4 Ọgọọst 1962 |
Asụsụ obodo | Swahili |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Swahili, Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị, injinia |
Ọkwá o ji | Member of the National Assembly of Tanzania |
ebe agụmakwụkwọ | University of Dar es Salaam, Norwegian University of Science and Technology |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Party of the Revolution |
kọwara na URL | http://www.parliament.go.tz/mps-list |
Stella Martin Manyanya (amụrụ n'ụbọchị nke anọ n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ 1962) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị CCM nke Tanzania na onye omeiwu maka mpaghara Nyasa kemgbe afọ 2010.[1] N'ọnwa Ọktoba 2017, a họpụtara ya dị ka osote minista nke ụlọ ọrụ, azụmahịa na itinye ego.[2]
Mmalite na agụmakwụkwọ ya
dezieỌ gara Nambingi Primary School, maka afọ mbụ ya n'ụlọ akwụkwọ elementrị, site na afọ 1969 ruo 1970. Ọ gara ụlọ akwụkwọ praịmarị Maguu, gụsịrị akwụkwọ elementrị n'ebe ahụ n'afọ 1975. Site na na afọ 1976 ruo na afọ 1979, ọ gara Songea Girls Secondary School, na Songea, maka ọmụmụ ya na Ordinary Level Secondary School.[1] O nwere nzere mahadum na injinia eletrik, nke ọ nwetara na Mahadum Sayensị na Teknụzụ nke Norway na Mahadụ nke Dar es Salaam.[1]
Akụkọ ihe mere eme nke ọrụ ya
dezieỌrụ mbụ ya bụ na Pugu Kaolin Mines Limited (nke a maara ugbu a dị ka STAMICO), ebe ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka eletrik site na afọ 1983 ruo na afọ 1987. N'afọ 1992 ruo na afọ 2005, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye injinia eletrik, maka Tanzania Electric Supply Company Limited (TANESCO), ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọkụ eletrik nke Tanzania, nke na-ahụ anya maka mmepụta ọkụ eletrik, nnyefe ọkụ eletrik na nkesa ọkụ eletrik. Na TENESCO, ọ na-ahụ maka atụmatụ, iwu akara na ọrụ.[1]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya
dezieỌ banyere na ndị omeiwu n'afọ 2005 na tiketi ndọrọ ndọrọ ọchịchị CCM. N'oge mbụ ya na ndị omeiwu, ọ rụrụ ọrụ na kọmitii ndị omeiwu na Investment, Energy na Minerals. Ọ rụkwara ọrụ na National Executive Committee (NEC) n'oge ahụ. A họpụtara ya ọzọ n'afọ 2010. N'oge nke abụọ ya, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye isi oche nke kọmitii ndị omeiwu na ụlọ ọrụ na azụmahịa, site na afọ 2010 ruo nah afọ 2011. Ọzọkwa n'otu oge ahụ, ọ bụ onye otu kọmitii ndị omeiwu na-ahụ maka ihe gbasara iwu, ezi ọchịchị na gọọmentị ime obodo.[1]
Site na afọ 2011 ruo na afọ 2015, ọ rụrụ ọrụ n'otu oge ahụ dị ka Kọmishọna Ógbè maka Ógbè Rukwa.[3] Ọ rụkwara ọrụ dị ka onye otu Kansụl Mahadum nke Mahadum Dar es Salaam, yana dịka onye otu kọmitii ndị omeiwu na Nchebe na Nche.[1]
A họpụtara ya ọzọ ka ọ bụrụ onye omeiwu nke ugboro atọ n'usoro n'afọ 2015. N'afọ 2015, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote minista nke agụmakwụkwọ, teknụzụ na ọzụzụ ọrụ aka, na-eje ozi na ikike ahụ ruo n'ọnwa Ọktoba na afọ 2017 mgbe a họpụtara ọ dị ka osote minisita maka ụlọ ọrụ na azụmahịa.[1][2]
Hụkwa nka
dezie- Stella Ikupa Alex
- Kọmitii nke Tanzania
Ebesidee
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 1.6 POTAN (5 November 2017). Parliament of Tanzania: Hon. Eng. Stella Martin Manyanya. Parliament of Tanzania (POTAN). Retrieved on 5 November 2017.
- ↑ 2.0 2.1 Lamtey. Magufuli Swears In New Ministers, Deputies. Retrieved on 5 November 2017.
- ↑ 24Tan (2015). After 10 deaths, RC stops cargo trucks to carry passengers. 24Tanzania.com (24Tan). Archived from the original on 7 November 2017. Retrieved on 5 October 2017.
Njikọ mpụga
dezieTempleeti:Tanzania Deputy MinistersTempleeti:Current CCM MPsTempleeti:Chama Cha MapinduziTempleeti:Cabinet of Tanzania