Stella Ikupa Alex
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Tanzania |
aha enyere | Stella |
aha ezinụlọ ya | Alex |
ụbọchị ọmụmụ ya | 1 Ọktoba 1979 |
Asụsụ obodo | Swahili |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee, Swahili |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | Member of the National Assembly of Tanzania |
ebe agụmakwụkwọ | Mzumbe University |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Party of the Revolution |
kọwara na URL | http://www.parliament.go.tz/mps-list |
Stella Ikupa Alex (amụrụ n'ụbọchị mbụ n'ọnwa Ọktoba n'afọ 1979), bụ onye na-ahụ maka ego na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Tanzania, onye so n'òtù Chama Cha Mapinduzi (CCM). Ọ bụ osote minista ugbu a n'ọfịs praịm minista nke Tanzania, nke na-ahụ maka ndị nwere nkwarụ.[1][2] Ọ na-ejekwa ozi dị ka onye omeiwu, ebe a họpụtara ya n'oche pụrụ iche n'afọ 2015.[1]
Mmalite na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ ya n'ụbọchị mbụ n'ọnwa Ọktoba afọ 1979. Ọ gara "Minazi Mirefu Primary School", na Dar es Salaam, obodo kachasị ukwuu na Tanzania na ebe azụmahịa, gụsịrị akwụkwọ na afọ 1994. Site na afọ 1995 ruo na afọ 1998, ọ gara Jangwani Girls Secondary School, kwa na Dar es Salaam maka ọmụmụ O-Level ya. Ọ nọrọ na Jangwani maka agụmakwụkwọ A-Level ya, gụsịrị akwụkwọ na afọ 2001.[1]
N'afọ 2002, a nabatara ya na Tanzania Institute of Accountancy, na Dar es Salaam campus, iji nweta Advanced Diploma na Accountancy. Mgbe e mesịrị, site na afọ 2009 ruo na afọ 2011, ọ gara nke ọma na Master of Science degree na Accountancy na Finance, na Dar es Salaam campus nke Mahadum Mzumbe.[1]
Akụkọ ihe mere eme nke ọrụ ya
dezieN'afọ 2007, ọ malitere ịrụ ọrụ na Ministry of Energy and Minerals nke Tanzania dị ka onye na-ahụ maka ego, na-eje ozi na ikike ahụ ruo n'afọ 2014. N'afọ ahụ, a kpọfere ya na Ministry of Industry and Trade nke Tanzania, dị ka onye na-ahụ maka ego, na-eje ozi n'ebe ahụ ruo n'afọ 2015.[1]
Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị
dezieStella Alex abụwo onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-arụsi ọrụ ike na obodo ya, na pati ndọrọ ndọrọ ọchịchị Cama Cha Mapiduzi na-achị, malite na 2003. Site mgbe ahụ ruo n'afọ 2015, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye na-ahụ maka akụ nke alaka pati ya. N'afọ 2013, ọ rụrụ ọrụ dị ka onye otu CCM District Constitutional Council.N'afọ 2015, ọ ghọrọ onye omeiwu n'okpuru ndokwa oche pụrụ iche.[1]
N'abalị asaa n'ọnwa Ọktoba n'afọ 2017, onye isi ala John Magufuli họpụtara ya ka ọ bụrụ osote minista, n'ọfịs praịm minista, nke na-ahụ maka ndị nwere nkwarụ.[2][3]
Hụkwa nka
dezie- Stella Martin Manyanya
Ebesidee
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 1.5 POTAN (2 November 2017). Parliament of Tanzania: Profile of Honourable Stella Ikupa Alex. Parliament of Tanzania (POTAN). Retrieved on 2 November 2017. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name "One" defined multiple times with different content - ↑ 2.0 2.1 The Citizen Reporter (7 October 2017). Several New Faces in Dr. Magufuli's Team. Retrieved on 2 November 2017.
- ↑ Lamtey (9 October 2017). Magufuli swears in new ministers, deputies. Retrieved on 2 November 2017.