Spellanza Baguma Muhenda
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Uganda |
ụbọchị ọmụmụ ya | 30 Ọktoba 1978 |
Ebe ọmụmụ | Uganda |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | legislator, administrator |
Ọkwá o ji | Member of the Parliament of Uganda |
Mpaghara ntuli aka | Kyenjojo District |
ebe agụmakwụkwọ | Kyebambe Girls Secondary School, Makerere University, Law Development Centre, Uganda Management Institute |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | National Resistance Movement |
Spellanza Baguma Muhenda (Ọktoba 30, 1978) bụ onye otu ndị omeiwu Uganda.[1]
Ọ bụ onye nnọchi anya nwanyị nke Kyenjojo District na mpaghara Tooro na Western Uganda onye nwere njikọ na National Resistance Movement (NRM).[2][3][4]
Mmalite na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Spellanza Baguma Muhenda na 30 Ọktoba 1978 n'ezinụlọ ndị Katọlik. Ọ gụsịrị akwụkwọ Uganda Certificate of Education na Kyebambe Girls S.S. na 1996. Ọ nọgidere na Kyebamba Girls S.s ebe ọ gụsịrị akwụkwọ ya Uganda Advanced Certificate of education na 1998. Ọ gara Mahadum Makerere nke afọ 2002 ebe ọ gụsịrị akwụkwọ na Bachelor of Education . Ọ gara maka agụmakwụkwọ ọzọ na Law Development Centre, Kampala ebe o nwetara asambodo na Law (Administrative Officers Law Course) n'afọ 2006. N'afọ 2008, ọ nwetara diplọma postgraduate ya na Public Administration and Management site na Uganda Management Institute.[1]
Ọrụ
dezieSite na afọ 2000 ruo na afọ 2002, Spellanza Baguma Muhenda bụ onye na-enye ọzụzụ na Ruwoda. Ọ ghọrọ onye isi mmemme nke otu ndị ntorobịa Engabu za Tooro site na afọ 2002 - 2003. Ọ bụkwa onye isi nchịkwa maka ichebe ụmụaka-Kyenjojo site na afọ 2004 ruo na afọ 2006. Ọ ghọrọ onye ndụmọdụ maka Gọọmentị Obodo Kyenjojo site na afọ 2002 ruo na afọ 2006. Ọ bụ onye na-edeba aha distrikti maka National Resistance Movement na afọ 2006. Na Kyenjo District Local Government na 2006-2010, Baguma bụ Onye isi osote odeakwụkwọ. Ọ bụkwa osote odeakwụkwọ ukwu maka Gọọmentị Obodo Kyegegwa site na afọ 2010 ruo na afọ 2015. Ọ ghọrọ onye omeiwu na Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda na afọ 2016 ruo taa.[1]
Ọ bụkwa onye otu Kọmitii Akụnụba Gọọmentị Obodo ma bụrụkwa onye otu kọmitii na-ahụ maka Ọrụ Ọha na Gọọmenti Obodo.[3] Ọ bụ osote onye isi oche nke Kọmitii Ahụike nke ndị omeiwu na 10th parliament nke Uganda na onye mmeri na nsogbu ahụike ọmụmụ mmekọahụ.[5][1][2]
Ọ bụ onye isi oche nke Network for African Women Ministers and Parliamentarians (NAWMP) ugbu a.[2][6][7]
O gosipụtara arịrịọ na-achọ ka gọọmentị tinye ụkpụrụ ndị dị mkpa ga-emetụta ndụ ndị na-eto eto.[7] Ọ na-ekwupụta nchegbu mgbe niile banyere arụmọrụ nke ndị ọrụ ahụike distrikti.[5] Ọ na-ekere òkè mgbe niile n'imeziwanye agụmakwụkwọ.[8] O sonyere n'ịmepụta atụmatụ mkpuchi ahụike onwe onye.[9]
Hụkwa
dezie- Nzukọ omeiwu nke Uganda
- Ógbè Kyenjojo
- National Resistance Movement
- Ndepụta nke ndị otu nke iri nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda
Njikọ mpụga
dezieEbenside
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 1.3 Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 2021-04-27. Retrieved on 2021-03-21.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 CS61_Baguma Spellanza Muhenda (en). Nairobi Summit (2019-11-11). Retrieved on 2021-03-21.
- ↑ 3.0 3.1 (April 2020) The Parliamentary Performance Scorecard 2018- 2019. Kampala: AFRICA LEADERSHIP INSTITUTE, 98, 124, 128, 350. ISBN 978-947478-111-0.
- ↑ BAGUMA SPELLANZA MUHENDA (en-US). NRM. Archived from the original on 2021-07-31. Retrieved on 2021-03-21.
- ↑ 5.0 5.1 SSEBAGGALA (2019-08-03). Achest boss calls for recentralisation of district health workers recruitment to fill vacancies (en-US). Nile Post. Retrieved on 2021-03-21.
- ↑ Network of African Women ministers and Parliamentarians - Uganda Chapter (en). parliament of the Republic of Uganda (2018-03-01). Retrieved on 2021-03-21.
- ↑ 7.0 7.1 "Trust and empower us" – young Ugandans on their sexual and reproductive health and rights (en). UNFPA ESARO (2019-09-10). Retrieved on 2021-03-21.
- ↑ MPs want education curriculum reviewed (en-GB). Watchdog-Uganda (2019-08-10). Retrieved on 2021-03-21.
- ↑ independent (2019-06-06). Private Member's Bill likely to delay Health Insurance scheme –Ministry of Health (en-US). The Independent Uganda. Retrieved on 2021-03-21.