Sierra (ụgbọ mmiri nwere injin)
Oge/afọ mmalite | 1916 |
---|---|
mba/obodo | Njikota Obodo Amerika |
dị na ngalaba nhazi mpaghara | Aberdeen |
nhazi ọnọdụ | 46°58′31″N 123°48′2″W |
heritage designation | National Register of Historic Places listed place |
Sierra bụ ụgbọ mmiri nwere akụkọ ihe mere eme nke a na-eji ebu osisi. E wuru ya n’afo 1916, a gbakwunyere ya na National Register of Historic Places n’afo 1978.
Akụkọ ihe mere eme
dezieE wuru Sierra na Matthews shipyard na Hoquiam maka E. K. Wood Lumber Company ma bụrụ ụgbọ mmiri mbụ e wuru na Grays Harbor.[1][2][3] Bolinder rụrụ injin ụgbọ mmiri ahụ na obodo Sweden, nke zigara onye nnọchi anya ka ọ lekọta nrụnye ha.[4] Senator Miles Poindexter gara mgbe a malitere ụgbọ mmiri ahụ n’ Ogust 30, n’afo 1916.[5]
Njem mbụ ya dịSkiwa ogologo bụ Valparaíso, nke obodo Chile.[2] Sierra nwere ike mezue njem na-agagharị na-enweghị mmanụ.
A na-eji Sierra ebugharị osisi n'etiti Bellingham, Washington na Hoquiam, Washington. N'ime otu ọnwa n’afo 1920, Sierra buuru mbupu nke 1,200,000 ụkwụ osisi site na Bellingham.[6]
Na Febụwarị 7, n’afo 1923, Sierra mebiri nke ukwuu mgbe ya na ụgbọ mmiri Wilhemina kụrụ n'oké alụlụ dị nso na San Francisco; e mere atụmatụ na mmebi buzikwa $ 135,000.
Mgbe afo 1926, Sierra gbara ọkụ na Berth 77 na ọdụ ụgbọ mmiri nke obodo Los Angeles, ọkụ mbụ nke ụgbọ mmiri ọkụ Los Angeles City No. 2 lụsoro.[7]
E rere Sierra n’afo 1927 ma tinye ya na ihe eji eme friji iji buru anụ reindeer site na Alaska maka ụlọ ọrụ ụgbọ njem Arctic.[8] N'oge Agha Ụwa nke Abụọ, ndị agha US na-arụ ọrụ Sierra dịka ụgbọ ọzụzụ. Mgbe agha ahụ gasịrị, e kenyere Sierra na Maritime Commission na Olympia, Washington, ma mesịa ree ya ma nyefee ya ndi otu Lake Union.[8]
Mgbe afọ 1964, onye nwe ụlọ ọhụrụ ahụ malitere iweghachi Sierra na nhazi mbụ ya, nke bu ibu osisi.
Edensibia
dezie- ↑ (1919) "On the Shores of Grays Harbor". Pacific Marine Review 16.
- ↑ 2.0 2.1 (1921) Motorship. Miller Freeman. Kpọpụta njehie: Invalid
<ref>
tag; name "motorship" defined multiple times with different content - ↑ "Hoquiam", Anacortes American, 14 Sep 1916, p. 6.
- ↑ "Machinery Arrives for the Steamer Sierra", Aberdeen Herald, 8 Sep 1916, p. 8. Retrieved on 16 Nov 2019.
- ↑ "Lumber Town for Poindexter", The Seattle Star, 31 Aug 1916, p. 8.
- ↑ (March 1920) "Bellingham". The Timberman 21.
- ↑ South Bay History: Fireboat No. 2, the Ralph J. Scott, served the Port of Los Angeles with distinction for 78 years (en-US). Daily Breeze (2019-05-20). Retrieved on 2019-11-16.
- ↑ 8.0 8.1 (1977) The H.W. McCurdy marine history of the Pacific Northwest, 1966-1976, McCurdy, H. W. (Horace Winslow), 1899-1989., Newell, Gordon R., Seattle Historical Society, Seattle: Superior Pub. Co, 387–388, 546, 554. ISBN 0875642209. OCLC 2646126.