Samwel Mohochi
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya26 Jụn 1972 Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye na-akwado ikike mmadụ, onye ọka iwu Dezie

Samwel Mukira Mohochi (amụrụ n'ọnwa June n'ụbọchị iri abụọ na isii, afọ 1972 na Nairobi, Kenya) bụ onye Kenya na-ahụ maka ikike mmadụ na onye ọka iwu, nwere ahụmịhe iwu dị ukwuu na ikpe ikike mmadụ n'ụlọ ikpe mba. Ọ bụ onye na-akwado ikike mmadụ na mba ụwa n'ihu ndị na-ahụ maka nkwekọrịta na United Nations Human Rights Council.

Nkụzi mmalite dezie

Samwel Mohochi gụrụ akwụkwọ n'ụlọ akwụkwọ ọha na eze na Kenya. Ọ gara Kimathi Estate Primary School n'agbata afọ 1980 rụọ afo 1985, Ụlọ akwụkwọ praịmarị nke Rabai Road n'agbata afọ 1985 rụọ afọ 1987, ebe o ruru eru maka Asambodo ule izizi nke Kenya (KCPE). O mechara gaa St Paul's High School Amukura na Teso District n'agbata afọ 1988–1990 na Kisii High School n'agbata afọ 1990–1991, ebe o ruru eru maka asambodo Kenya Certificate of Secondary Education (KCSE).

Agụmakwụkwọ dị elu dezie

Samwel Mohochi gụrụ akwụkwọ maka Bachelor of Laws Degree LLB na Babasaheb Dr. Ambedkar Law College, Nagpur University na India, n'agbata afọ 1992 rụọ afọ 1997; ọ gụsịrị akwụkwọ na klas nke abụọ.

O debara aha ya maka ule ọka iwu ya na Ụlọ akwụkwọ iwu Kenya n'afọ 1998, emesịa gụsịrị akwụkwọ na diplọma ya na iwu n'afọ 2000.

Ọ gụsịrị akwụkwọ na Masters na Law LLM na Transitional Justice Institute University of Ulster n'afọ 2009 rụọ afọ 2010 na edemede akpọrọ "Jurisdiction of the ICC: Realpolitik sitere na ndị otu steeti na Rome Statute na United Nations Security Council na arụmọrụ ya.

Ihe nrite na ihe ịga nke ọma dezie

Front line Human Rights Defender Award Nominee n'afọ 2009.

Edensibia dezie