Samuel Okwaraji
ụdịekere | nwoke |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
obodo maka egwuregwu | Naijiria |
aha enyere | Samuel |
ụbọchị ọmụmụ ya | 19 Mee 1964 |
Ebe ọmụmụ | orlu |
Ụbọchị ọnwụ ya | 12 Ọgọọst 1989 |
Ebe ọ nwụrụ | Lagos |
Ụdị ọnwụ | eke na-akpata |
ihe kpatara ọnwụ | heart failure |
ọrụ ọ na-arụ | Onye otu egwuregwu bọọlụ |
ọnọdụ egwu na otu / ọpụrụiche | etiti etiti |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1985 |
ụdị egwuregwu | footbọl |
so na | 1988 Summer Olympics, 1988 African Cup of Nations |
Templeeti:Infobox football biographySamuel Okwaraji
Personal information
Aha Samuel Sochukwuma Okwaraji
Ụbọchị ọmụmụ 19 Mee 1964
Ebe ọmụmụ Orlu, Naịjirịa
Ụbọchị ọnwụ 12 Ọgụstụ 1989 (afọ 25)
Ebe ọnwụ Legọọsụ, Naịjirịa
Ebe ọ na-agba Midfielder
Ọrụ ntorobịa
1984–1985 AS Roma
Ọrụ okenye*
Afọ Tiimụ Apps (Gls)
1985–1986 Dinamo Zagreb 1 (0)
1986–1987 Austria Klagenfurt 14 (0)
1987–1989 VfB Stuttgart 0 (0)
1987–1988 → SSV Ulm (loan) 28 (5)
1989 Kon.Berchem Sport (BEL)
Nachọnalụ Tiimụ
1988–1989 Naịjirịa 8 (1)
Samuel Sochukwuma Okwaraji (19 Mee 1964 - 12 Ọgụstụ 1989) bụ ọkachamara n'egwuregwu bọọlụ gbaara mba Naịjirịa na mba ofesi. Ọ bụkwa ọkaiwu ruru eru nke nwere masịtasị na iwu mba ụwa na Mahadum Pontifical Lateran nke Rome. Ọ dara ma nwụọ n'ihi obi mgbawa na nkeji 77 nke asọmpi egwuregwu nke Iko mba ụwa ha na Angola na ama egwuregwu Legọọsụ na Surulere, Legọọsụ Steeti na 12 Ọgụstụ 1989.
Ọrụ
dezieA mụrụ Ọkwaraji na 19 Mee 1964 na Orlu, Imo Steeti, Naịjirịa.
Okwaraji nwere ọrụ na Iroopu nke gụnyere ị gbara AS Roma (1984-1985), NK Dinamo Zagreb (1985-1986), Austria Klagenfurt (1986-1987), VfB Stuttgart (1987-1989) na SSV Ulm 1846 (mbite) 1987-1988) ka ọ gụchara akwụkwọ na iwu. Na obere oge ya na Dinamo Zagreb, Samuel nyere goolu atọ n'egwuregwu enyi na enyi na NK Budućnost Hodošan. A gbara bọọlụ a na 30 Epurel 1986, Dinamo Zagreb meriri 12-0. naanị bọọlụ Samuel gbaara ndị Dinamo na Yugoslav bụ mmadụ ka ọnọchi na 18 Mee 1986 ha na FK Priština . A gbara ya n'ama egwuregwu Maksimir na Zagreb, agba nke iri abụọ na iteghete nke afọ 1985/86. Dinamo Zagreb meriri 4: 3.
Ọrụ mba ụwa
dezieO so na ndị otu egwuregwu nke "Green Eagles" na 1988 na asọmpi nke iko mba Afrịka nke afọ ahụ, o nyere otu goolu kachasị ọsọ na akụkọ ntolite nke mmeri ha na "Indomitable Lions" nke Cameroon. O sonyere were gbaa bọọlụ ikpeazụ, ebe Cameroon meriri "Eagles" meriri site na otu goolu
Egwuregwu ikpeazụ na ọnwụ
dezieOkwaraji dara nkeji iri site na njedebe nke asọmpi iko mba ụwa 1990 ha na Angola na Legọọsụ . [1] Ọ nwụrụ site na nsogbu nke ọrịa obi mmapụ dịka ọtọpsịị gosipụtara na nwa amadị a nwere ọrịa obi na ọbara mgbali elu . [2] [3]
Ihe Nketa ekpe
dezieNa Mee 19, 2019, ụbọchị nwesịrị ị bụ afọ iri ise na ise ncheta ọmụmụ ya. E nyere ya nsọpụrụ site na-ịgbanwe njimara gọgụlụ ụbọchị ncheta ọmụmụ, tinye ya Ọkwaraji.
Hụ kwa
dezie- Ndị otu egwuregwu bọọlụ nwụrụ mgbe ha na-egwu egwu
Nsidee
dezie- ↑ Audu, Samm. "Nigeria remembers fallen hero Samuel Okwaraji 20 years after", Goal.com, 12 August 2009.
- ↑ Ojo, Tokunbo. "13 Years After Special tribute to Samuel Okwaraji", Gamji.
- ↑ "2 decades after a Patriot's death", Nigerian Tribune, 10 August 2009.