Samira Merai
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Tunisia |
aha n'asụsụ obodo | سميرة مرعي |
aha enyere | Samira |
aha ezinụlọ ya | Merai |
ụbọchị ọmụmụ ya | 10 Jenụwarị 1963 |
Ebe ọmụmụ | Zarzis |
ọrụ ọ na-arụ | Onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị |
Ọkwá o ji | Member of the 2011 Constituent National Assembly, Minister of Health, Minister of Women Affairs |
ebe agụmakwụkwọ | Claude Bernard University Lyon 1 |
affiliation | LR18SP02 |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | Afek Tounes |
Mbido ndụ na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ Merai na 10 Jenụwarị 1963 na Zarzis . Ọ gara ụlọ akwụkwọ sekọndrị teknụzụ na Medenine wee nweta nzere na mgbakọ na mwepụ na sayensị n'afọ 1981. Ọ gụsịrị akwụkwọ na Faculty of Medicine na Tunis na 1986, na-ahụ maka ọrịa akpa ume.[1][2]
Ọrụ
dezieMerai malitere ịrụ ọrụ na Abderrahmen-Mami Hospital na Aryanah na 1993. N'afọ 2003, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote prọfesọ nke Respirology na Faculty of Medicine na Tunis. Ọ bụ onye otu European Respiratory Society na American Thoracic Society.[1]
Merai bụ onye otu Afek Tounes ma sonye na kọmitii etiti ya na Mee 2011.[1] A họpụtara ya ka ọ bụrụ onye omebe iwu maka mpaghara Medenine na 23 Ọktoba 2011.[2] N'ụbọchị mbụ n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2012, a họpụtara ya ka ọ bụrụ osote onye isi oche nke NCA.[3] Mgbe agbasachara Afek Tounes, ọ ghọrọ onye otu Republican Party, mana ọ gbara arụkwaghịm na 10 Julaị 2013.[4] A họpụtaghi ya ọzọ na ntuli aka ndị omeiwu nke afọ 2014.
N'ụbọchị nke abụọ n'ọnwa Febụwarị n'afọ 2015, a họpụtara Merai ka ọ bụrụ Minista nke Ụmụ nwanyị, Ezinụlọ na Ụmụaka n'ọchịchị Praịm Minista Habib Essid.[2][3][5] N'abalị iri abụọ n'ọnwa Ọgọstụ n'afọ puku abụọ na iri na isii , a họpụtara ya ka ọ bụrụ Mịnịsta na-ahụ maka ahụike ọha na eze na ụlọ ọrụ Youssef Chahed.[6][7][8]
Merai lụrụ di ma nwee ụmụ atọ.[2]
Ebenside
dezie- ↑ 1.0 1.1 1.2 DOSSIERSBiographie de Samira Merai Friâa, ministre de la Santé publique (French). Business News (20 August 2016). Retrieved on 23 January 2017.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 Gouvernement Youssef Chahed: Qui est Samira Merai, ministre de la Santé?. Direct Info (21 August 2016). Retrieved on 23 January 2017.
- ↑ 3.0 3.1 Tunisian minister says more pro-women reform needed. The Arab Weekly (21 August 2015). Archived from the original on 8 March 2017. Retrieved on 23 January 2017.
- ↑ Tunisie-Politique : La députée Samira Merai Friaa quitte le parti Al-Joumhouri. Kapitalis (11 July 2013). Retrieved on 23 January 2017.
- ↑ Achouri (4 February 2015). Ennahda joins new government lineup. Al Monitor. Retrieved on 23 January 2017.
- ↑ Samira Merai says "optimistic" about future of Chinese-Tunisian health co-operation. Agence Tunis Afrique Presse (21 October 2016). Retrieved on 23 January 2017.
- ↑ Tunisia PM-designate presents unity govt line-up. The Daily Star Lebanon (20 August 2016). Retrieved on 23 January 2017.
- ↑ Briki (31 August 2016). Notes on Tunisia's New National Unity Government. Project on Middle East Democracy. Archived from the original on 1 December 2017. Retrieved on 23 January 2017.