Safia Elmi Djibril

onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Djibouti na onye na-akwado ikike ụmụ nwanyị
Safia Elmi Djibril
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
mba o sịDjibouti Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1963 Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Dezie

Safia Elmi Djibril (amụrụ ya n'afọ 1963) bụ onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke obodo Djibouti na onye na-ahụ maka ikikere ụmụ nwanyị.

Ọ bụ onye otu National Assembly site na People's Rally for Progress party, nke bụ akụkụ nke Union na-achị maka njikọ aka nke Presidental Majority.

Ọrụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dezie

Safia Elmi Djibril bu ụzọ banye na ndọrọ ndọrọ ọchịchị site na ọrụ ya na mmemme ahụike nke obodo Djibouti.

Ọ bụ onye na-emegide igbu ọkpụkpụ nwanyị na omume ọdịnaala ndị ọzọ na-emerụ ụmụ nwanyị na ụmụaka ahụ.[1][2][3][4]

National Assembly dezie

Djibril bụ onye otu National Assembly site na People's Rally for Progress party, nke nwere njikọ na Union for the Presidential Majority coalition.[5] Ọ na-anọchite anya Quartier 7, mpaghara nke isi obodo nke obodo ahu.[6]

A họpụtara ya na ntuli aka ndị omeiwu Djiboutian nke afọ 2008, na-esonyere ọnụ ọgụgụ dị nta nke ụmụ nwanyị ndị ọzọ n'ime ụlọ ahụ gụnyere Aïcha Mohamed Robleh ya na Hasna Barkat Daoud.[7]

Djibril bụ akụkụ nke ọtụtụ ụmụ nwanyị batara na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Djibouti n'afọ ndị na-adịbeghị anya. Enweghị ụmụ nwanyị na ndị omeiwu Djibouti na afo 2000, mana ugbu a iwu chọrọ ka ọ dịkarịa ala pacenti iri abuo na ise nke ndị omeiwu bụrụ ụmụ nwanyị, ọnụ ụzọ nke fọrọ nke nta ka ọ zute na ntuli aka nke afo 2018.[8][9][10]

N'afọ 2019, Djibril nyere aka guzobe otu ụmụ nwanyị n'ime ndị otu omebeiwu.[11]

Ọ na-eje ozi dịka osote onye isi ala nke abụọ na kọmitii onye isi ala Ismaïl Omar Guelleh ma bụrụ onye otu Ụlọikpe Kachasị Elu.[12][13][14]

Òtù Pan-Afrika dezie

Ihe Djibril na-elekwasị anya na-aga n'ihu na ahụike ụmụ nwanyị na ụmụaka, ọ bụkwa osote onye isi oche nke Kọmitii Inter-African na Omenala Na-emetụta Ahụike nke Ụmụ nwanyị na Ụmụaka, na-anọchite anya nwanyị mbụ nke obodo Djibouti Kadra Mahamoud Haid.[1][15]

Ọ bụkwazi onye otu Pan-Afrikan Parliament, na-eje ozi dịka osote onye isi oche nke ahụ ruo afo 2018.[1][16][17] Ọ rụkwara ọrụ dịka akụkụ nke Pan-Afrikan Parliament's Women's Caucus.[18]

Edensibia dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 Vice Presidents (en-US). Inter-African Committee on Traditional Practices (IAC). Archived from the original on 2021-06-24. Retrieved on 2021-01-15.
  2. Djama (November 2009). MGF: plaidoiries pour la fin d’un fléau psycho-socio-culturel (fr). Human Village. Retrieved on 2021-01-15.
  3. Conferenza sub-regionale per l'eliminazione delle mutilazioni genitali femminili (it). Radio Radicale (2005-02-02). Retrieved on 2021-01-15.
  4. Saint-Jean (2001-01-25). CONFERENCE SUR LES MUTILATIONS GENITALES FEMININES. A UNE SEMAINE DU GRAND JOUR LE MEDIA SE MOBILISENT (fr). La Nation. Archived from the original on 2021-06-24. Retrieved on 2021-01-15.
  5. 8ème Législature (fr). Assemblée Nationale de Djibouti. Archived from the original on 2020-11-21. Retrieved on 2021-01-15.
  6. Hared (2019-03-07). Djibouti/Somalie : La branche Habar-Awale/Isaaq de la mafia djibouto-somalienne et sa connexion avec les islamistes de la Corne. (fr-FR). HCH24. Retrieved on 2021-01-15.
  7. 6ème Législature. Assemblée Nationale de Djibouti. Archived from the original on 2022-03-03. Retrieved on 2021-01-15.
  8. Musau (2019-04-08). African Women in politics: Miles to go before parity is achieved (en). Africa Renewal. Retrieved on 2021-01-15.
  9. IPU PARLINE database: DJIBOUTI (Assemblée nationale), Last elections. Inter-Parliamentary Union. Retrieved on 2021-01-15.
  10. Djibouti ruling party claims landslide parliamentary win (en). Africanews (2018-02-26). Retrieved on 2021-01-15.
  11. CAUCUS DES FEMMES PARLEMENTAIRES DJIBOUTIENNES (CFPD) (fr). Assemblée Nationale de Djibouti (2019-12-17). Archived from the original on 2019-12-24. Retrieved on 2021-01-15.
  12. Membre du bureau du Président (fr). Assemblée Nationale de Djibouti. Archived from the original on 2022-03-18. Retrieved on 2021-01-15.
  13. VISITE OFFICIELLE D'UNE DÉLÉGATION DE HAUT NIVEAU DU CONGRÈS DES ETATS-UNIS (fr). Assemblée Nationale de Djibouti (2019-10-02). Archived from the original on 2022-03-03. Retrieved on 2021-01-15.
  14. Commission de la haute cour de justice (fr). Assemblée Nationale de Djibouti. Retrieved on 2021-01-15.
  15. Semprini (2018-10-12). A Gibuti i militari italiani in prima linea su sicurezza e cooperazione (it-IT). La Stampa. Retrieved on 2021-01-15.
  16. "Pan African Parliament to swear in new legislators", Channel Africa, 2018-05-07.
  17. "Parlement panafricain: le bureau recomposé", Cameroon Tribune, 2018-05-15. (in fr)
  18. UNFPA rallies parliamentarians (en). UNFPA ESARO (2016-07-30). Retrieved on 2021-01-15.