Rose Mutonyi Masaaba
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Uganda |
aha enyere | Rose |
ụbọchị ọmụmụ ya | 20 Ọgọọst 1949 |
Ebe ọmụmụ | Uganda |
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye aka | Bekee |
ọrụ ọ na-arụ | onye nkuzi |
Ọkwá o ji | member of parliament |
Mpaghara ntuli aka | Bubulo West County |
ebe agụmakwụkwọ | Watakhuna Primary School, Nyondo Secondary School, Makerere University |
onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị | National Resistance Movement |
Rose Mutonyi Masaaba nke a makwaara dị ka Rose Mutonyi bụ onye nkuzi Ugandan, na onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ onye nnọchi anya nwanyị Manafwa District Bubulo County West, ọkwá ọ nọ na ya kemgbe 2016.[1][2][3][4] Ọ bụ onye otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị National Resistance Movement.[3][4]
Mmalite na agụmakwụkwọ
dezieA mụrụ ya n'ụbọchị iri abụọ n'ọnwa Ọgọstụ afọ 1949.[3][4] Rose Mutonyi Masaaba gara Nyondo Junior Secondary School maka agụmakwụkwọ ụlọ akwụkwọ sekọndrị ya na 1964.[3]
N'afọ 1968 ọ gụsịrị akwụkwọ dị ka onye nkuzi nwere onye nkuzi Grade II nwere asambodo na 1974 gụsịrị akwụkwọ dịka onye nkuzi nke Grade III na asambodo ndị nkuzi Grate III na 1979. Rose nwetara diplọma na agụmakwụkwọ ma mesịa na 1986, ọ nwetara nzere bachelọ nke nka ma mesịa n'afọ 1997 ọ gụsịrị akwụkwọ na Master of Education na Mahadum Makerere ma nweta nzere ndị a niile na Mahadim Makerere n'oge dị iche iche.[2]
Ahụmahụ ọrụ
dezieAha ya | Ụlọ ọrụ | Afọ |
---|---|---|
Onye ndụmọdụ | Ministri nke Mmekọrịta Mba Ọzọ | 2003 na 2010 |
Isi | Nazigo Teacher Training College | 1989-1997 |
Onye isi oche | Busubizi Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Nkụzi | 1986-1988 |
Onye nkuzi | Ụlọ akwụkwọ praịmarị Gangama | 1976 |
Onye omeiwu | Nzukọ omeiwu nke Uganda | 2016 ruo taa |
Onye nkuzi | Ụlọ akwụkwọ praịmarị Nabuyonga | 1974-1975 |
Onye nkuzi | Ụlọ akwụkwọ praịmarị ụmụ nwanyị Muyembe | 1971-1972 |
Onye nkuzi | Ụlọ Akwụkwọ Ngosipụta Nyondo | 1969-1971 |
Mutonyi jere ozi dị ka onye ndụmọdụ na onye na-ahụ maka ndekọ ego na ọrụ mba ọzọ nke Uganda na New Delhi na Dar es Salaam.[2] Ọfịs ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya dị na Sibanga Sub County na Sibanga Trading Center.[5]
Ọrụ ndị omeiwu
dezieE wezụga ọrụ ya dị ka ọkà okwu nke Nzukọ Ndị Omeiwu Ugandan, ọ na-anọdụ na kọmitii ndị omeiwu ndị a:[3]
- Kọmitii na-ahụ maka ihe gbasara mba ọzọ dị ka onye isi oche.[2]
- Kọmitii Azụmaahịa, Onye otu.
- Kọmitii na sayensị na teknụzụ, Onye otu.
Ndụ onwe onye
dezieỌ bụ onye Katọlik site n'okwukwe.[5]
Hụkwa
dezie- Nzukọ omeiwu nke Uganda
- Onye omeiwu
- Ógbè Manafwa
- Ndepụta nke ndị otu nke iri nke Nzukọ Ndị Omeiwu nke Uganda
Ebensidee
dezie- ↑ Minister Kitutu battles 4 new challengers for Manafwa seat (en). Daily Monitor. Retrieved on 2021-04-04.
- ↑ 2.0 2.1 2.2 2.3 NAMULOKI. ROSE MUTONYI: ambassadors put marriages at risk (en-gb). The Observer - Uganda. Retrieved on 2021-04-04.
- ↑ 3.0 3.1 3.2 3.3 3.4 Parliament of Uganda. www.parliament.go.ug. Archived from the original on 29 April 2021. Retrieved on 14 April 2020.
- ↑ 4.0 4.1 4.2 MUTONYI ROSE MASAABA (en-US). NRM - NETTECH RELIABLE MEDIA. Archived from the original on 2021-08-03. Retrieved on 2021-04-04.
- ↑ 5.0 5.1 Hon. Mutonyi Masaaba Rose (en-US). MPScan Uganda. Archived from the original on 2022-10-17. Retrieved on 2021-04-04.