Roland Mqwebu
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịSouth Africa Dezie
Aha enyereRoland Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya16 Jenụwarị 1941 Dezie
Ebe ọmụmụInanda Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya28 Ọgọọst 2015 Dezie
Ebe ọ nwụrụDurban Dezie
asụsụ ọ na-asụ, na-ede ma ọ bụ were na-ebinye akaBekee Dezie
Ọrụ ọ na-arụomee, omee Dezie

Roland Mqwebu (16 Jenụwarị 1941 na 28 Ọgọst 2015) bụ onye na-eme ihe nkiri na South Africa nke ama ama maka ọrụ ya dịka James Mkhize, InDuna na mantshingelani (onye nche) na sitcom Emzini Wezinsizwa .[1]

Mmalite ndụ dezie

A mụrụ Mqwebu na Jenụwarị 16, 1941, na Inanda dịka nwa nke atọ n'ime ụmụ 13. O tolitere n'ezinụlọ Ndị Kraịst nwere ndị na-eme ihe nkiri na ndị na-agụ egwu. Ọ mụtara otú e si akpọ piano wee malite idekọ egwu nke ya. Ọ rụrụ ọrụ dịka onye na-agụ egwu maka Phuzekhemisi.[2]

Onye na-eme ihe nkiri dezie

Ụfọdụ n'ime ihe nkiri mbụ a ma ama nke Mqwebu bụ Diamante sir Gefahrlich (1965), uDeliwe (1976) na Shaka Zulu (1986).[3] Maka Shaka Zulu, ọ bụ osote onye nduzi ma rụọ ọrụ nke Ngomane kaMqoboli, enyi Shaka na onye isi nke ezinụlọ Mthethwa.[1] A maara ya nke ọma maka ọrụ ya dịka Mkhize, onye induna na onye nche na-ebi na Ụlọ 8 nke ụlọ oriri na ọṅụṅụ na Jerry Phele (Thabang Mofokeng), Jabulani Nkosi (Benson Chirwali), Vusi Thanda (Moses Tshawe) na Shadrack Ngema (inyanga uMagubane).

Ndụ onwe dezie

Mqwebu biri na Belleview Gardens na Durban, South Africa. Ọ lụrụ Pinky Mqwebu, onye bụbu onye nkuzi, ha nwekwara ụmụ anọ. Otu, Lawrencia, na-arụ ọrụ dịka onye na-emepụta ọdịnaya na Ukhozi FM.[4]

Ọnwụ dezie

Mqwebu nwụrụ n'ihi ọrịa akụrụ[5] na 28 Ọgọstụ 2015, mgbe ọ dị afọ 74 na Ethekwini Heart Hospital and Heart Centre.

Edemsibịa dezie

  1. 1.0 1.1 RDM News Wire. Minister 'shocked and sad' to hear about death of actor Roland Mqwebu. Times LIVE. Retrieved on 2 October 2015.
  2. Citypress Sunday 10 May 1998 p. 22:. naspers.com. Archived from the original on 27 September 2015. Retrieved on 2 October 2015.
  3. Roland Mqwebu na IMDb
  4. Citizen reporter. Emzini Wezinsizwa's Roland Mqwebu has died. The Citizen. Archived from the original on 3 May 2016. Retrieved on 2 October 2015.
  5. Daily Sun. TV legend Roland Mqwebu has died!. Daily Sun. Archived from the original on 2015-10-17. Retrieved on 2 October 2015.