Roger Graham Barry (ụbọchị iri na atọ n'ọnwa Nọvemba n'afọ 1935 rụọ ụbọchị iri na itoolu n'ọnwa Machị afọ 2018) bụ onye America a mụrụ na Britain na-ahụ màkà ọdịdị ala na ihu igwe.

Ọ nwetara nzèrè doctorate na Mahadum Southampton n'afọ 1965 wee bídó ịkụzi na Mahadim Colorado afọ atọ ka e mesịrị. Mgbè ọ na-eduzi National Snow and Ice Data Center site n'afo 1976 ruo 2008, Barry natara Guggenheim Fellowship na 1982, e nyère ya fellowship nkè American Geophysical Union na 1999, ma kụzie na Mahadum Moscow State dị ka Fulbright Scholar na 2001. Tupu ọ hapụ Russia, a kpọrọ Barry ónyé mba ọzọ so na Russian Academy of Natural Sciences. N'afọ 2007, e nyère Barry ihe nrite onye guzobere ya site na Royal Geographical Society. Ọ lara ezumike nká n'afọ 2010, ma nwụọ n'ubochi irí na itoolu n'ọnwa Machị 2018, mgbe ọ dị afọ asatọ abụọ.[1]

Edensibia dezie

  1. "In Memoriam: Professor Emeritus Roger Barry", University of Colorado, 21 March 2018. Retrieved on 24 March 2018.