Prince Nico Mbarga

Nigeria Blogger na mmetụta
Edinyanga Essien
Mmádu
ụdịekerenwoke Dezie
mba o sịNaijiria, Kameroon Dezie
Aha ọmụmụNicolas Mbarga Dezie
Ụbọchị ọmụmụ ya1 Jenụwarị 1950 Dezie
Ebe ọmụmụAbakaléké Dezie
Ụbọchị ọnwụ ya23 Jụn 1997 Dezie
Ebe ọ nwụrụCalabar Dezie
Ụdị ọnwụaccidental death Dezie
ihe kpatara ọnwụtraffic collision Dezie
Ọrụ ọ na-arụonye egwu, singer-songwriter, guitarist, hotel manager Dezie
oge ọrụ ya (mmalite)24 Jụn 1997 Dezie
ngwa egwuxylophone, conga, drum kit, electric guitar Dezie
ụdịIgbo highlife Dezie

Àtụ:Infobox musical artist Prince Nico Mbarga

Aha Ọmụmụ Nico Mbarga

Aha Otutu Prince Nico

Ọmụmụ 1 Jeụwarị 1950

Si Malite Obubra, Cross River Steeti, Naịjirịa

Nwụọ 23 Juunu 1997 (afọ 47)

Nkenụụdị Haịlaịf

Akaọrụ Iti egwu, Ọdee egwu, Onye mmepụta egwu

Afọ Keomume 1970 – 23rd Juunu 1997

Ndị egwu Mmetụta Chief Osita Osadebe

Nico Mbarga (1 Jenụwarị 1950 - 23 Juunu 1997), onye amara nke ọma dịka Prince Nico Mbarga, bụ onye na-agụ egwu haịlaịf, nne ya bụ onye Naịjirịa, nna ya bụrụ onye Cameroon.A mụrụ ya na Abakeleke, Naịjirịa. [1] Ọ bụ onye ama ama maka egwu ya akpọrọ "Sweet Mother", nke ọ dekọrọ abụ ya site na ndị ịgba ya bụ Rocafil Jazz, nke akọwapụtara dịka abụ kacha ere ahịa n'akụkọ ihe mere eme site n'aka onye na-emepụta egwu n'Afrịka. [2]

Egwu dezie

Ọ na-akpọ zaịlofonuu, konga, Ịgba, jita bazị na jita eletiriiki. Ọ bụ ụzọ malite egwu ịgba n'ụlọakwụkwọ. Ọ mere akaọrụ izizi ya n'otu ịgba ụlọ ọriri na nkwari akụ, nke aha ya bụ Melody Orchestra, na 1970.

Ọrụ dezie

Oge mmalite dezie

Agbanyeghị na o dere otu egwu ama ama "Sweet Mother" na 1976, nke rere ihe karịrị nde iri na atọ (nke amatara dụka otu n'ime egwu kachasị n'Afrịka), Mbarga rụrụ oke ọrụ dị mkpa na mgbanwe nke egwu Afrịka ama ama . Site na olu si na mkpuru obi ya nke pụtara ihe n'olu ụtọ jita ya, Mbarga mepụtara ngwakọ pụrụ iche jita ndi Naịjiria na jita ndị Congo nke na-akwalite mmụọ ma ahịrịụda haịlaịf. O hibere otu nke ya, Rocafil Jazz, ka ọ na-eme ihe nkiri oge niile na Plaza Hotel dị na Ọnịcha nke Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa .

Mgbe ha wepụtasịrị egwu na-akụda mmụọ na 1973, Mbarga na Rocafil Jazz nwere ọganihu nke mbụ na nke abụọ ha, I No Go Marry My Papa, nke bụ egwu ama ama na mpaghara. Enweghị ike otu ịgba ndịa iwu ewu karịa gburugburu ha kpatara nkwekọrịta ndekọ egwu ha na EMI ji were kwụsị, mkpebi nke gosipụtara enweghị isi mgbe ndị otu ahụ bịanyere aka na Rogers All Stars, otu ụlọ ọrụ na-edekọ egwu na Naịjirịa nke dị na Onicha, wee dekọọ "Sweet Mother". [3]

"Sweet Mother" bụ egwu ekwere n'asụsụ bekee agwara ọgwa. O so na egwu kachasị ere n'akụkọ ihe mere eme na egwu ndị Naịjirịa. N'ime afọ isii nke Mbarga na Rocafil Jazz nọgidere na Rogers All Stars, 1975 ruo 1981, ha dekọtara abọm iteghete.

Mechaa afọ dezie

Na njem njegharị ya na England na 1982, a bịara mara Mbarga maka ọmarịcha egwu ya, 1970s glam rock kpalite mmụọ ya na emume ngosi ya. Mgbe ọ ka gara n'ihu ya na Rocafil Jazz, Mbarga na otu ịgba Ivory Coast na onye sonyeburu na egwu haịlaịf nke ndị London Louisiana Tilda, onye Cameroon nwere olu egwu. N'agbanyeghị na Mbarga na-ebupụta otu ndekọ egwu ya bụ Polydor mgbe ọ laghachiri Naịjirịa, ya na ndị otu nsịnambụ ya na Rocafil Jazz kewara n'ihi nnukwu esemokwu. Agbanyeghị na ọ mechara mepụta Rocafil Jazz Band ọhụrụ, mana Mbarga enweghịzị ike ime nke ọma ka o si mee na mbụ. Ọ hapụrụ egwu, gaa nlekọtaba ụlọ oriri na nkwari akụ ya anya, "Sweet Mother Họteelụ" dị na obodo Ịkọm na Cross River Steeti Naịjirịa, nke dị naanị nkeji ole na ole site na ókè-ala Cameroon na Naịjirịa.

Ọnwụ dezie

Prince Nico Mbarga nwụrụ n'ihe mberede ọgba tum tum na 23rd Juunu 1997, Ọ hapụrụ "Sweet Mother" dịka egwu kachasị ewu ewu n'etiti ndị Naịjirịa. [1] Mgbe ụfọdụ a na-akpọ "Sweet Mother" "ukwe Afrịka" ndị na-agụ akwụkwọ na ndị na-ege BBC tụnyere ya vootu dịka egwu ọkacha mma na Afrịka

Ngwale Egwu dezie

Àtụ:Listen

Nsidee dezie

Njikọ dị na mpụga dezie