Peace Anyiam-Osigwe
ụdịekere | nwanyị |
---|---|
mba o sị | Naijiria |
ụbọchị ọmụmụ ya | 30 Maachị 1969 |
Ebe ọmụmụ | Nkwerre |
Ụbọchị ọnwụ ya | 9 Jenụwarị 2023 |
Ebe ọ nwụrụ | Lagos |
ọrụ ọ na-arụ | filmmaker |
ebe agụmakwụkwọ | Oxford Brookes University |
oge ọrụ ya (mmalite) | 1986 |
Peace Anyiam-Osigwe (1969-2023), onye bụbu Peace Anyiam-Fiberesima MFR amụrụ n'abalị iri atọ n'ọnwa Maachi bụ onye Naịjirịa na-eme ihe nkiri na Onye isi ntụrụndụ nke akpọrọ "eze nwanyị nke ihe nkiri Nollywood". [1] O bu onye hiwere emume ihe nkiri n’uwa niile bụ, Africa Movie Academy Awards . Akwụkwọ akụkọ The Guardian dere na ọ bụ ọsụ ụzọ na-egosi ihe nkiri Nollywood na mmemme ihe nkiri mba ụwa. [2] Ọ duziri vidiyo egwu mbụ nke mmetụtara hip-hop bụ, P-Square . N’afọ 2012, gọọmentị Naịjirịa mere ya onye otu ‘Federal Republic ’ maka mgbalị ya na ụlọ ọrụ ihe nkiri/ntụrụndụ. [3] [4] Ọ bụ onye otu TED . [5]
Mmalite Ndụ
dezieAnyiam-Osigwe amụrụ na abalị iri-ato nke onwa Maachi [6] O sitere na ezi ama ama bụ ezi Osigwe Anyiam-Osigwe dị na Nkwerre, Imo Steeti . Ọ bụ naanị nwa nwanyị n'ime ezinụlọ nwere ụmụaka asatọ. [7] O nwere asambodo Iwu na politikal sayensị na Mahadum Oxford Brookes . [8]
Ọrụ
dezieAwọdụ nke Afrika Moovi Akademi
dezieAnyiam-Osigwe guzobere Africa Film Academy, otu na-achịkwa emume ihe nkiri kemgbe afọ 2005. Emere nturu ugo a ka ọ bụrụ otu n’ime onyinye kacha nwee ùgwù nye ndị Afrika nọ n’ememe ihe nkiri. Na mbipụta nke iri, ọ rịturu dị ka onye isi nke AMAAs. Na 2015, ọ malitere atumatu AfricaOne iji cheta ndị Afrika ngalaba ọrụ ntụrụndụ. [9]
Odide Ọrụ
dezieAnyiam-Osigwe bụ odee nke abụ ederede. O nwere akwụkwọ ato nyere ya nkwalite. [5] N'ajụjụ ọnụ Alana Herro, ọ kọwara uri dịka otu n'ime ụzọ iji gosipụta nghọta ya na nghọta nke ihe gbara ya gburugburu. Tupu ọ banye mahadum, o bipụtara otu magazin akpọrọ, Clicks, nke edepụtara iji kwado ndị ojii na England. Ọrụ ya gbadoro ụkwụ na nkwado/nkwuchitere ọnụ.
onye nduzi ihe nkiri/TV
dezieỌrụ Anyiam-Osigwe na telivishọn malitere site na ihe omume mkparịta ụka bụ, Piece off my mind, nke na-elekwasị anya na mmeghachi omume ndị mmadụ na nsogbu obodo nke anaghị ahụkarị na mgbasa ozi. [5] Okwu ngosi ya gbadoro ụkwụ n'okwu gbasara ịkwuchitere ndị mmadụ n'otu n'otu ndị bụ ndị obodo anaghị elebakarị anya. O rụrụ aka n'usoro ihe nkiri Afrika, ịzụ ụmụaka na ịha nhatanha ụmụ nwanyị dịka mpaghara na-amasị ya na ihe nkiri na telivishọn. Na mbido egwu abụọ, ọrụ P-Square, Anyiam-Osigwe bụ onye lekọtara ha. Na 2016, o kwuru na ya na-anọchite Somkele Inyamah. [10]
Ndụ onwe
dezieNwanne ya nwoke bụ, Michael, onye e gburu na 2014 bụ onye nhazi nchịkọta nke Osigwe Anyiam-Osigwe Foundation, otu na-anaghị achọ uru na-enyeghachi ndị Naijiria. [11] Ọ bụkwa onye nduzi, "Afrika Institute for Leadership Research and Development” na kansul jeneral nke Malawi na Naịjirịa. [12] Nne ya, Dorothy Chinyere Anyiam-Osigwe bụ onye nnata nke Office of the Order of the Niger site n’aka onye isi ala n’oge ahụ bụ, Olusegun Obasanjo maka ọrụ ebere ya na Naịjirịa. [13] Ya na di ya kewapụrụ [14]
Nrụtụaka
dezie- ↑ Elizabeth Johnson. Female Narratives in Nollywood Melodramas. Lexington Books.
- ↑ Chidera Muoka (13 March 2016). The Undiluted Creative: Peace Anyiam Osigwe. guardian.ng. Archived from the original on 23 September 2016. Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ Adeola Adeyemo (10 September 2012). 149 Nigerians to Receive Federal Government Award – Mike Adenuga, Teco Benson, Tony Elumelu, Sarah Sosan among Recipients. bellanaija.com. Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ Full list of Nigerians shortlisted for National Honours. Channels TV (10 September 2012). Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ 5.0 5.1 5.2 Alana Herro (22 October 2010). Fellows Friday with Peace Anyiam-Osigwe. ted.com. Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ Celebrity Birthday: Peace Anyiam-Osigwe. nollywoodmindspace.com (30 March 2014). Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ Adie Vanessa Offiong (9 May 2015). Peace Anyiam-Osigwe: Growing up in the midst of boys made me strong. dailytrust.com.ng. Archived from the original on 6 February 2017. Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ Nigeria: Peace Anyiam Osigwe - I Left My Marriage With My Handbag and My Sanity. allAfrica.com (29 March 2014). Retrieved on 23 September 2016.
- ↑ Funsho Arogundade (15 September 2015). AMAA Founder, Peace Anyiam-Osigwe launches AFRICAONE. P.M. News. Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ PEACE ANYIAM-OSIGWE RETURNS TO ARTISTE MANAGEMENT. thenationonlineng.net (17 September 2016). Retrieved on 24 September 2016.
- ↑ Michael Anyiam-Osigwe, brother of AMAA founder shot dead. premiumtimesng.com. Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ Michael Anyiam-Osigwe Is Dead, Killed By Armed Robbers. saharareporters.com. Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ CHIEF (MRS.) DOROTHY CHINYERE ANYIAM-OSIGWE (OON). Archived from the original on 23 September 2016. Retrieved on 22 September 2016.
- ↑ "Why my marriage crashed – Peace Anyiam-Osigwe". Retrieved on 22 September 2016.