Packy na Marlon bu Ihe ejije egwuriegwu eji akuziri mmadu Ihe nke WaveQuest meputara mana o bu ndi Raya Systems buputere ya maka ndi Super Nintendo Entertainment System. E doziri ya Ka oji malite agwa umuaka nwere Diabetes mellitus type 1. Egwuregwu ahụ nwere ihe ịga nke ọma na ndị otu ọgwụgwọ.[1] Ọ bụ akụkụ nke usoro egwuregwu vidio nkuzi sitere na Raya nke gụnyere Captain Novolin, Rex Ronan: Experimental Surgeon na Bronkie the Bronchiasaurus.

N'afọ 1998, Kid's Health Software wepụtara egwuregwu ahụ maka kọmputa onwe onye.

Egwuregwu

dezie

Otu ìgwè òké wakporo Camp Wa-kee, ma zuo nri na ọgwụ, zoo ha n'akụkụ dị iche iche nke Camp ahụ. N'ihi ya, Packy na Marlon, enyí abụọ na-arịa ọrịa shuga, na-arụ ọrụ iji weghachite ngwongwo ndị e zuru na ịchụpụ ụmụ oke ọjọọ, ka ha na-echetakwa ịṅụ Insulin ha ma nyochaa glucose ha n'ọbara ha.Na ngwụcha egwuregwu ahụ, ha na-eche ndị isi ọjọọ Veets na Yebur nke Lunch Room Crew ihu.  

  1. "Click Health to Debut Packy & Marlon CD-ROM for Juvenile Diabetes at American Academy of Pediatrics Annual Meeting", Business Wire, October 12, 1998.