Otu Na-ahụ Maka Ikike Ruuru Mmadụ na Mba Naijiria
E guzobere Otu Na-ahụ Maka Ikike Ruuru Mmadụ na Mba Naijiria (“NHRC”) site na iwu nke amadebere maka Otu Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ (Ndezigharị), na afọ 1995, nke iwu NHRC megharịrị, na afọ 2010. Otu nkea na ahụ maka usoro na egbochi mmebi iwu nke na-echekwa ikike mmadụ nke ndị bi na obodo Naijiria. Ọ na-enyocha ikike ruuru mmadụ na Naịjirịa, na-enyere ndị e metọrọ aka maka imebi ikike ruuru mmadụ aka, ma na-enye aka n'ịwepụta amụma gọọmentị nke Naịjirịa gbasara ikike oruuru mmadụ. [1]
Otua na-arụ ọrụ na nyocha na nlekota nke ọtụtụ ọnọdụ ikike ruuru mmadụ kemgbe ọ malitere. [2] Otu nke Amnesty International welitere olu tinyere ihe gbasara ụjọ ndị uweojii na Naịjirịa na enye Otu Na-ahụ Maka Ikike Ruuru Mmadụ na Mba Naijiria na afọ 2012. [3]
Onye Isi Ode Akwukwo ugbu a bụ Anthony O. Ojukwu Esq. [4]
Hụ kwa
dezie- Ihe ndị ruuru mmadụ na Naịjirịa
- Otu Na-enyocha Mmebi Ikike Ndị Ruuru Mmadụ na Nigeria
Ebe Nsi Dee
dezie- ↑ Agbamuche-Mbu (2015). Nigeria and its Human Rights Commission, Articles. THISDAY LIVE. Archived from the original on 2015-04-02. Retrieved on 2015-03-28.
- ↑ National Human Rights Commission. INFORMATION NIGERIA. Retrieved on 2015-03-28.
- ↑ Nigeria: End police intimidation of National Human Rights Commission. Amnesty International (2012-04-13). Retrieved on 2015-03-28.
- ↑ Ofeibea Quist-Arcton (2015-03-27). As Nigeria Votes, The Specter Of Boko Haram Hangs Over The Election. NPR - Parallels. Retrieved on 2015-03-28.
Njikọ dị na mpụga
dezie- National Human Rights Commission, saịtị ọrụ
- National Human Rights Commission of Nigeria, Maitama, Abuja, Nigeria. Archived from the original on 2022-01-27. Retrieved on 2021-04-25.