Riz gras maọbụ riz au gras bụ nri anụ na osikapa na nri Obodo ndi a gunyere Beninese, Burkinabé, Guinean, Ivorian, ya na Togolese, nke West Afrika. A na-akwadebe ya na mba ndị ọzọ dị n'Afrịka, dịka obodo Senegal, ebe a na-akpọ ya tiebou djen ma jiri nnukwu azụ na anụ kwadebe ya. N'ebe ọdịda anyanwụ Afrịka na-asụ Bekee, a na-akpọ nri ahụ Jollof rice.

Osisi osikapa na Côte d'Ivoire

A na-ejikarị Riz gras eme ihe oriri na ọṅụṅụ n'obodo ukwu nke Burkina Faso. A na-eji anụ na akwụkwọ nri dị ukwuu akwadebe nri Riz gras, a na-enyekarị ya n'elu osikapa. Ihe ndị ọzọ a na-eji eme nri a gụnyere tomato, eggplant, bell peppers, karọt, cabbage, onion, galik, anụ maọbụ akwụkwọ nri, mmanụ na nnu.

Ihe ngosiputa dezie

Hụkwazie dezie

  • Ndepụta nri osikapa
  • Sindhi biryani

Edensibia dezie