Ogwu akpata
essential medicine, vaccine type
obere ụdị nkevaccine Dezie
vaccine forAkpata Dezie

Ọgwụ akpata bụ ọgwụ mgbochi emere maka mgbochi akpata.[1] Mgbe enyesịrị ya otu ugbo pasent 85 nke ụmụaka ndị enyere ya nke dị ọnwa itolu na pasent 95 ndị gaferela otu afọ agaghị enwezi ya.[2] Ndị niile nwere ya mgbe enyesịrị ha ọgwụ ahụ nke mbụ ya n'enwe ya mgbe enyere ha ọgwu ahụ nke ugbo abụọ. Mgbe ndị enyere ọgwụ a n'ogbe gafere pasent 93, anaghị enwezi ya, mana onwere ike ịbịaghachi maọbụrụ n'ike ọgwụ ahụ ebelata. Ọgwu a n'anọ n'ime ahụ ọtụtụ afọ, mana odochabeghị anya m'ọga abịaghachi. Ọbụrụ n'enye ọgwụ a 'oge, mgbochi a ga-apụta ihie karịa.[1]

Ọgwụ a anaghị emetụta ọrịa ndịọzọ nke n'onye nwere nje obirinajaocha nwere ike ịgba ya. Nke a gụnyere mgbu ebe ahụ agbara ọgwụ maọbụ oyiọmụma. Enyochala nsogbu ahụike a ma hụ n'ọbụ otu onye n'ime nde narị mmadụ nwere ike inwe ya. Ọnọdụ ahụ arụghị orụ ka okwesịrị, orịa uche ezughị ezu na n'ọria mmebi nke mgbari afọ anaghizi arị elu ka odịbu.

Ọgwụ a n'arụkarị ọnụ na ngwakọta ndịọzọ. Ótú mba ụwa akpọrọ Wọld Helt Ọganaịzeshọn nyere ntụziaka k'ana-enye ọgwụ a mgbe nwatakịrị kwesịrị ka agbaa ya ọgwụ a mgbe ọdị naanị ọnwa itolu n'akụkụ uwa ebe odịkarị. Mana ebe ọdịghị,, enwere ike ịgba ya. n'ọnwa iri na abụọ. Ọnọ anọ n'ahụ ogologo oge. Ọ na-adị ka ntụ ọcha nke a na-eji mmiri gwakọta tupu agbanye ya n'ahụ. Ihe n'egosi n'ọgwụ ahụ rụrụ orụ bụ mgbe elere ọbara mmadụ.[1]

Ihe dịka pasent 85 ụmụaka n'ụwa niile agbaala ogwụ mgbochi kemgbe 2013.[3] Na 2008, ọdịkaria ala mba dị 192 gbara ya ugbo abụọ.[1] Ebidoro ya na afọ 1963.[2] Nke a ebukọtara ya na rubela ọnụ bidoro dịwa na afọ 1971.[4] Ọgwụ mgbochi nke chikinpọs sonyere na afọ 2005 nke bulitere ọnụọgụ ya ruo ato nke akpọziri ọgwụ mgbochi MMRV.[5] Ótú mba ụwa akpọrọ Wọld Helt Ọganaịzeshọn ji ya mee ihe dịka ọgwụ ha ga-eji eme ihe nke kasị mkpa maka nlekọta ahụike.[6] Ọgwụ a adịghị okeọnụ.[1]

Njikọ dezie

  1. 1.0 1.1 1.2 1.3 1.4 "Measles vaccines: WHO position paper" (PDF). Weekly epidemiological record. 84 (35): 349–60. 28 August 2009. PMID 19714924.
  2. 2.0 2.1 Control, Centers for Disease; Prevention (2014). CDC health information for international travel 2014 the yellow book. p. 250. ISBN 9780199948505
  3. "Measles Fact sheet No 286". who.int. November 2014. Retrieved 4 February 2015.
  4. "Vaccine Timeline". Retrieved 10 February 2015.
  5. Mitchell, Deborah (2013). The essential guide to children's vaccines. New York: St. Martin's Press. p. 127. ISBN 9781466827509.
  6. "WHO Model List of EssentialMedicines" (PDF). World Health Organization. October 2013. Retrieved 22 April 2014.