Nnyocha Ntụle Oké Ifufe Europe

European Storm Forecast Experiment, nke a maara dị ka ESTOFEX, bụ atụmatụ nke otu ndị Europe na-ahụ màkà ihu igwe, na ụmụ akwụkwọ na meteorology guzobere n'afọ 2002. Ọ na-eje ozi dị ka ikpo okwu màkà mgbanwe nke ihe ọmụma banyéré ịkọ ọdịnihu oké ifufe na Europe na ébé ndị ọzọ. Ọ bụ òtù ọrụ afọ ofufo ma ugbu a enweghị ego. Ebumnuche ya bụ ịkwalite mmata na inye agụmakwụkwọ n'oge banyéré amụma ihu igwe siri ike.[1] ESTOFEX na-enye ịdọ aka ná ntị màkà oké ifufe kwa ụbọchị. Ọ na-anakọta akụkọ sitere n'aka ọha na eze banyéré ihe omume ihu igwe siri ike iji kwado amụma ya.[2] A ga-enyefe akụkọ na European Severe Weather Database (ESWD).

A na-ebipụta amụma ESTOFEX n'okpuru ikike ngwá Creative Commons Attribution-Noncommercial-Share Alike 3.0.

Nkọwa ya nkè ihe omume ihu igwe siri ike bụ otu ma ọ bụ ọtụtụ n'ime ihe ndị a:[1]

siri ike:

  • hail nwèrè dayameta nke ọ dịkarịa ala 2.0 cm (0.8 in),
  • ajọ ifufe,
  • ifufe na-efe na ọsọ nke ọ dịkarịa ala 25 m / s (49 ),
  • oke mmiri ozuzo nke dịkarịa ala 60 mm (2.4 in).

oke njọ :

  • hail nwèrè dayameta nke ọ dịkarịa ala 5.0 cm (2.0 in),
  • ifufe na-efe na ọsọ nke ọ dịkarịa ala 33 m / s (64 ),
  • ajọ ifufe nke F2 siri ike ma ọ bụ karịa na Fujita scale.

Dị ka nzukọ nké na-elekwasị ányà na ọnọdụ ihu igwe na-arụ ọrụ, ya bụ amụma ihu igwe, ESTOFEX na-arụ otu ihe na US Storm Prediction Center (SPC). Njikọ nyocha bụ European Severe Storms Laboratory (ESSL) nke n'onwe ya na-eṅomi ihe dịka US National Severe Stormas Laboratory (NSSL), na ndị ibe US abụọ na-enweta nkwado siri ike dị ka ụlọ ọrụ gọọmentị ogologo ógè.

Edensibia dezie

  1. 1.0 1.1 ESTOFEX FAQ
  2. Verification of ESTOFEX Lightning and Severe Weather Forecasts Alex Kowaleski,, Dr. Harold E. Brooks, Dr. Charles A. Doswell III. pdf

Njikọ mpụga dezie