Nneka Egbujiobi
Mmádu
ụdịekerenwanyị Dezie
Ebe ọmụmụBoston Dezie
Ọrụ ọ na-arụOnyeisi azụmahịa, onye ọka iwu, academic Dezie
ebe agụmakwụkwọUniversity of Wisconsin Law School Dezie

Nneka Colleen Egbujiobi bụ onye ọkaiwu si obodo Naijiria. Ọ bụ onye Afrika nke Amerika, onye amaara nke ọma dịka onye guzọbere Hello Africa ma bụrụ onye isi oche ya.[1][2][3]

Mmụta na ọrụ dezie

Egbujiobi gụsịrị akwụkwọ na Mahadum nke Michigan nweta asambodo maka asụsụ Bekee na akwụkwọ ọgụgụ, tupu ya agaa Mahadum mmuta iwu nke Wisconsin Law ebe ọ natara akara ugo mmụta na iwu na 2012 wee bụrụ onye ọkaiwu, na-arụ ọrụ na Pasadena, California. N’oge ya na Mahadum Michigan, ọ bụ onye nta akụkọ mahadum nke CNN . Mgbe ọ na-arụ dika okaiwu maka afọ ole na ole, ọ guzọbere Hello Africa, ngwa mkpakọrịta nwoke na nwaanyị n'ịntanetị.[4][5][6] Egbujiobi rụrụ ọrụ dịka onye ntaakụkọ maka Beloit Daily News. Ọ rụrụ Judy Robson ọrụ mgbe ọ bụbụ onye isi ndị ụlọ nnọchite anya nke Wisconsin State Senate.[7][8]

Ndụ ya niime dezie

A mụrụ Egbujiobi na Boston, Massachusetts ma o tolitere na Wisconsin. O si Okija, Ihiala na Anambra Steetị. Nna ya bụ Leo Egbujiobi, onye dọkịta na-ahụ maka ọrịa gbasara obi na onye ọrụ ebere. Nne ya bụ Bridget Egbujiobi. N’afọ 1979, nne na nna ya si Naịjirịa kwaga Amerịka.[5][4][9]

Ebe m si dee dezie