Nnedi Okorafor

Onye Naijiria-American odee nke fantasy, akụkọ sayensị na ihe ọchị

Nnedi Okorafor (Aha: Nnedimma Nkemdili Okorafor; onye nke ejiri Nnedi Okorafor-Mbachu mara; a muru ya na April 8, na afo 1974)[1] bụ nwa afọ Naijiriya nke amụrụ na mba Amerika. Ọ na ede ihe gbasara echiche nke na enweghi atụ nke bekee na akpọ fantasy, agbara bekee nke enwekwara ike kpọ sayensi na kwa akụkọ ifo ndi ozo.

Nnedi Okorafor
Múrú (1974-04-08) 8 Eprelụ 1974 (age 50)
Cincinnati, Ohio, United States
OrüOnye édémédé akwụkwọ
Nnedi Okorafor

Ihe Gbasara Okorofor dezie

A mụrụ Nnedi Okorafor na mba Amerika. Nne na nna ya bu ndi Igbo nke di na obodo Naijiriya. Ọdi na mbụ abiarute Naijiriya site na mgbe ọ di na nwata. Mgbe ọ bidoro gụba akwụkwụ na ụlọ akwụkwụ nke Homewood-Flossmoor High School, e jiri i pia egwuregwu aka nke bekee na akpọ tennis jiri mara Okorafor. Nwa ada nkea pụrụ iche na agba kwa ezigbo mbo na ihe gbasara agbara bekee nke enwekwara ike kpọ sayensi. Okorafor na ekwu na ihe gbasara agụma akwụkwọ bụ ihe nke ọ hụrụ na anya karia ihe nke ana agbara mbọ. Ihe ọria ndachi nke bekee na akpọ scoliosis biara danyere Okoroafor ma mekwa ka ije ya na i pia egwuregwu aka nke bekee na akpọ tennis wee kwụsi ma mekwa ya ka ọna atụ ụkwụ ma ọgawa ije. Oge nkea ka Okoroafor biara leba anya na ime onwe ya bia kọwaharia onwe ya maka ije ya na i pia egwuregwu aka nke bekee na akpọ tennis biara kwụsi. Mgbe Okoroafor gbakewere na ọria, o bidoro dewe nderende na akwụkwọ. Akwụkwụ nke Okoroafor na ede na egosipụta mgbọrọgwụ ya na West African na kwa Amerika.

Okorafor gụrụ akwụkwu na Clarion Writers Workshop nke Lansing, Michigan ma pụtakwa na afọ 2001. Onwekwara asambodo nke PhD na asụsụ bekee nke ana akpọ English na mahadum nke University of Illinois, Chicago. Nnedi bụ kwa onye nkuzi nke ọkachamara na ihe nderede nke bekee na akpọ creative writing na literature na mahadum nke University at Buffalo, (SUNY). Okorafor na ezi na ụlọ ya bi na etiti Buffalo na Olympia Fields, Illinois[2].

Ihe Ndị O Dere Na Nnabata Ha dezie

Ihe Nkwalite dezie