Njoku ji

Njoku JI bụ chi na edu ji na ala Igbo ndị mmadụ ndi nke bi na odida ọwụwa anyanwụ nke Nigeria . Na-ufodu obodo di na-ala Igbo, a ka na-eme emume kwa afọ iji sọpụrụ chi a nke a na akpo Ifejioku. N'akuku ufodu, umuaka ndi raara onwe ha nye ozi nke chi a ka ana akpo Njoku. Dika ndi okenye, a na ele anya na umuaka a ga abu Di Ji ndi n'eme ofuma na oru ugbo nke ga eme ka ha soro na ndi nwere ugwu na obodo.

Emume Ihu-ji-na-ama dezie

Ndị ụkọchukwu nke Njoku Ji na-eme otutu emume nke otu n'ime ya bu Ihu-ji na-ama, ebe onye ụkọchukwu ga ebu ndi nzukọ okenye uzo n'iru ji na etiti ama nzuko ndi obodo . Emume ihu-ji-na-ama a bu emume e ji amalite oge ịgha mkpụrụ, nke bu eziokwu bu na, a naghị ekwe ka akuo ji obula na ala ma oburu na emeghi emume a, nke bu na ihe iku ji n'oge tupuu emee emume a na-ebute abu m onu nye onye mere etu a ya na ndi ezi-na-ulo ya.