Neema Namadamu bu one na akwado udo nakwa ikikere nke umunwaanyi na ndi nwere nkwaru na Democratic Republic nke Congo(DRC). O choputara Maman Shujaa Media Center iji na akwalite umunwaanyi ma nwekwa olu iji ko akuko ha.. [1]

Akụkọ ndụ

dezie

A mụrụ Namadamu na High Plains nke Itombwe na South Kivu Province . [2] Mgbe ọ dị afọ abụọ, ọ butere Ọrịa polio ma nwee nkwarụ n'ihi ọrịa ahụ.[3] N'ihi nke a, nna ya kpebiri ịlụ nwanyị nke abụọ n'ihi na na na DRC, a na-elekarị ụmụaka nwere nkwarụ anya dị ka ọbụbụ ọnụ. [1] Ọ na-echeta na mgbe ọ bụ nwatakịrị, o nweghị mkpara, ya mere nne ya, Polline Nyirambarato, buuru ya n'azụ gaa ụlọ akwụkwọ mgbe ọnọdụ okporo ụzọ dị njọ. Namadamu malitere ịkwalite mmata maka ndị nwere nkwarụ mgbe ọ nọ n'ụlọ akwụkwọ sekọndrị ma nwee Ihe ngosi redio nke ya.[4] Ka e mesịrị, mgbe ọ gara kọleji, ọ ghọrọ nwanyị mbụ nwere nkwarụ site n'ebo ya ka ọ gụsịrị akwụkwọ na mahadum dị na DRC.[5]

Mgbe ọ gụsịrị akwụkwọ, a họpụtara ya dị ka onye nnọchi anya South Kivu Province na National Assembly.[5] Mgbe ọ rụchara ọrụ na Nzukọ Ndị Omeiwu, ọ ghọrọ onye ndụmọdụ teknụzụ maka Minista na-ahụ maka Mmekọahụ na Ezinụlọ nke DRC.[1][5]

Mgbe nwa nwanyị Namadamu dị afọ iri abụọ na ise, ndị otu ndị agha mba Congo wakporo ya ma tie ya ihe.[6] Namadamu chetara na ọ "nwere ọchịchọ siri ike maka ịbọ ọbọ," Otú ọ dị, ọ họọrọ ịkwụsị usoro ịbọ ọwara ma kama ịlụso ndị mmadụ ọgụ, "Anyị na-alụso usoro ahụ ọgụ", ka o kwuru.[7] Namadamu guzobere Maman Shujaa Media Center nke na-arụ ọrụ na World Pulse, netwọk na-enye ụmụ nwanyị ike n'ụwa niile.[8] Nzukọ ahụ dị na Bukavu, ebe ọ nwere ike inye ụmụ nwanyị agụmakwụkwọ dijitalụ.[1] Maman Shujaa pụtara "Nwanyị dike" ma emere ọrụ ahụ ọ bụghị naanị iji kụziere ụmụ nwanyị, kamakwa iji nye ha ikpo okwu iji kesaa akụkọ ha na ụwa.[2] Nwanyị ọ bụla na-amụta ịghọ "onye na-eme ihe dijitalụ" na DRC.[3] Ọrụ ya na-egosi "ịnagide na mkpa ụmụ nwanyị nọ na Congo ndị bi na gburugburu ebe obibi nke na-emegbu ụmụ nwanyị n'ụzọ dị egwu".[9]

Onyinye

dezie

N'onwe November 2023, abara ndi BBC's 100 Women list Namadamu. [10]

  1. Cunningham. "Making a Difference in Hell", The Daily Beast, April 4, 2014. Retrieved on 19 September 2015.
  2. Namadamu. "Congo's Hero Women: Creating a Different Future", Huffington Post, 18 April 2014. Retrieved on 19 September 2015.
  3. Activist Spotlight: Neema Namadamu. Nobel Women's Initiative (13 February 2014). Archived from the original on 20 February 2016. Retrieved on 18 September 2015.
  4. Namadamu. Neema Namadamu. World Pulse. Retrieved on 19 September 2015.
  5. 5.0 5.1 5.2 Neema Namadamu: When Women Roar!. Channel Initiative. Archived from the original on 4 March 2016. Retrieved on 19 September 2015.
  6. Neema Namadamu. Beauty in the Middle. Archived from the original on 8 March 2023. Retrieved on 19 September 2015.
  7. Dear. "Neema Namadamu, Congo's Visionary Peacemaker", National Catholic Reporter, 15 October 2013. Retrieved on 19 September 2015.
  8. Afzal. "Digital Connections Empower Women to Change Their Futures", Mashable, 23 September 2013. Retrieved on 19 September 2015.
  9. Smith (22 July 2013). Women and Congo: When We Are Together, We Are Strong. Enough. Retrieved on 19 September 2015.
  10. BBC 100 Women 2023: Who is on the list this year? (en-GB). BBC News (November 23, 2023). Retrieved on 2023-11-24.